Ibe nwaanyị ugwu(FGM)nke amakwa dịkaibe nwaanyị mma n’ihe ojiri bụrụ nwaanyịnaibe nwaanyị ugwu,ka mba ụwa n’ahụ maka ahụike akpọrọ Wold Helt Oganaịzeshọn(WHO) kọwara dịka “iwepụ ihe n’ime ihe nwaanyị jiri bụrụ nwaanyị n’ụzọ ekwesịghị ekwesị.” FGM bụ omenala ebe ụfọdụ na agbụrụ ụfodụ na Afrịkana mba 27nana ọdịda anyanwụ Afrịka, n’emekwa n’ogo dị ala n’Eshia na mba Midụl Isti na n’etiti ndị bisara ebisa ebe niile.
obere ụdị nke | genital modification, female genital trauma, injury |
---|---|
ihu nke | iguzosi ike n'ezi ihe nke anụ ahụ, women's health |
aha mkpirisi | FGM, MGF, MGF, MGF, КОЖПО |
A na-eme ya site na mgbe amụrụ nwa nwaanyị ọhụrụ ruo mgbe obidorola toputawa mmadụ; n’ebe ufọdụ enwere ndekọ maka ya, a na-ebe ha ugwu a tupu ha eruo afo ise.
Onwere ụzọ ndịọzọ dị iche iche esi eme ya n’agbụrụ ụfọdụ. Nke a gụnyere iwepu kpamkpam akụkụ ụfọdụ nke ihe nọ n’ebe nwaanyị sị amụ nwanaihe ndị jikọrọ yama n’ime ma na mpụta[[]];ma nke kasị buo ibu n’ime ha (imechi ebe nwaanyị si enwe mmekọahụ) kpamkpam.[[|]] Na nke a, nke WHO kpọrọTaip 3FGM, a na-ahapụ obere oghere maka ebe mamịrị na nso nwaanyị si agbapụ ma hapụtụ ebe ụfọdụ maka inwe mmekọahụ n’ịmụ nwa. Ọnọdụ ahụike onye ahụ n’adabere k’esi mee ya, mana a na-ebute ọrịa na ya, mgbu, abụ ịgbapụta site n’oge ruo n’oge n’enweghị ike mụta nwa, n’inwe nsogbu n’oge ịmụ nwa.
A na-emekarị ya site n’igosi ụmụ nwaanyị na ha dị ala, imere ha mkpebi n’ụzọ ha kwesiri isi nwee mmekọahụ, n’igosi ha mkpa nke ịdị ọcha n’agwa dị nye ndịọzọ. Ndị n’akwalitekarị ya bụ ụmụ nwaanyị ndị n’ahụta ya n’ọbụ nnukwu ihe ugwu nye ha na ndị n’enwe egwu n’ọbụrụ na nwa ha maọbụ nwa nwa emeghị ya n’ọga eme ka anya dịrị ha n’elu Ihe karịrị nde ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị nwaanyị agabigala ihe a akpọrọ FGM na mba 29 ebe a na-emekarị ya. Emeela ya ihe karịrị nde asatọ na mba Djibaotu, Eriteria, Sọmalịa na Sudan.
Enweela iwu kagburu ibe ụmụnwaanyi ugwu n’ọtụtụ mba, mana anaghị etinye iwu ndị ahụ n’ọrụ. Mba ụwa ndị n’enwe nchegbu maka ya etinyela mgbalị pụrụ iche kemgbe 1970 ime ka ndị mmadụ kwusị ya, nke na afọ 2002 otu akpọrọ Unaịted Neshọn Jenaral Assembli, hụtara ibe nwaanyị ugwu dịka imegide mmadụ n’imebi ikike iwu nyere ya. Onwekwara ndị n’emegide ndị n’achụ ụdị mmekpa ahụ a ụkwu eru ala, ma karịsịa ndị n’amụ maka omume ndị mmadụ ebe dị iche iche dịka Erik Silvamanonye dere na ibe nwaanyị ugwu abụrụla isiokwu ha n’elebara anya nke enwerela ọtụtụ ajụjụ maka yak’osi metụta omenala, n’ụzọ osi kwesị ekwesị ma aga anabata n’ọbụ ihe n’emebị ugwu dịịrị mmadụ.
This article uses material from the Wikipedia Ìgbò article Ibe nwaanyị ugwu, which is released under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 3.0 license ("CC BY-SA 3.0"); additional terms may apply (view authors). Ọdịnaya dị n'okpuru CC BY-SA 4.0 belụsọ na edere ya otú ọzọ. Images, videos and audio are available under their respective licenses.
®Wikipedia is a registered trademark of the Wiki Foundation, Inc. Wiki Ìgbò (DUHOCTRUNGQUOC.VN) is an independent company and has no affiliation with Wiki Foundation.