Okeụgbọagha Russia, Pobeda

Pobeda (asụ̀sụ̀ Russia: Победа, pụrụ kà 'Mmeri') bụ̀ otù nà àtọ ǹke ikpeàzụ bụrụ okeụgbọagha ùdì-Peresvet b'ụzọ̀-dreadnought ǹkè ha rụ̀rụ̀ màkà òtùaghammiri nchịezèdi Russia nà m̀bìbì nnarịafọ̀ ìrin'ìtoolu.

Okeụgbọagha Russia, Pobeda
Okeụgbọagha Russia, Pobeda
pre-dreadnought battleship, ironclad warship
vessel classPeresvet-class battleship Dezie
aha gọọmentiPobeda Dezie
Onye ọrụImperial Japanese Navy, Imperial Russian Navy Dezie
Onye mmepụtaBaltic Shipyard Dezie
Ụlọ ọdụ ụgbọ mmiriLüshunkou District Dezie
country of registryRussian Empire Dezie

H'e dòrò ụgbọ ahụ̀ nà ibeụ̀sụ̀agha àbàdị Èke m̀gbè ha rụfụ̀tàrà ya, nà ọ bìtọ̀rọ̀ nà otu Arthur si nà afọ̀ 1903. M̀gbè agha Russia nà Japan ǹkè 1904–1905, ọ mètàrà je agha â, nà ọ̀gụ̀ otu Arthur nà Ehèrè Ògùrù. M̀gbe o mèrè zọpụ̀ tà nà oke mgbaji si ọ̀gụ̀ ndị â, ha ji ọkụegbè lukpù Pobeda nà mbaraọ̀gụ̀ otu Arthur, ya ème ndị Japan à zọpụ̀tà ya tinye ya nà umere òkpurù ahà Suwo (周防).

Okeụgbọagha Russia, Pobeda
Pobeda, nà nkechi iloma m̀gbè ịhẹ dị kà ibè ogè Ọnwaàtọ afọ 1904.

Ndị Japan mazị ya okpì, tikwazị ya ọsụ, ya ème òtùaghammiri nchịezèdi Japan (IJN) è doròwaria Suwo kà ụgbọ nchedo ìkperemmiri nà afọ̀ 1908 ya à gbara kà ụgbọ nzụzụ nà ọ̀tụ́tụ́ ógè. Ọ bụ̀rụ̀ ụgbọisi ibeụ̀sụ̀agha Japan ǹke gárá ọ̀gụ̀ ǹkè Tsingtao nà mbido Agha Ụ̀wà I, ya à gazie òtù ahụ̀ rùo m̀gbè ọ pụ̀rụ̀ kà ụgbọ nzụzụ egbè nà afọ̀ 1917. Ụgbọ â bìrì ị ji okpì nà afọ̀ 1922 kà ya nà ndiri edemkpezu òtùaghammiri Washington kwere, nà ọ dị kà h'e tikàrà ya n'ibè ogè ahụ̀.

Tags:

🔥 Trending searches on Wiki Ìgbò:

ChekiaIri atọSadiq Sani SadiqOnye omekome nke GorGame of ThronesAkwụkwọ NsọTATMJWashington, D.C.IhunanyaImo StateArabicIgwe magnetikRichard FeynmanBauchiNdị ÌgbòKapama Game ReserveNka na UzuWikipidiaỤlọ akwụkwọMoroccoNdepụta nkàLibyaAlbaniaHip hop musicFair useNicki MinajOrunotuTunisiaList of Nigerian states by date of statehoodOmenalaWMahadum nke Obafemi AwolowoBola TinubuAbiyote EndaleNova ScotiaSwedenCondomKMoremi AjasoroGoogleHafsat IdrisWWW - Olee Ụwa Dị EbubeChiomaFoodOlile anyanwu AmerikaBibleGhanaAbduljabbar Nasiru KabaraAtensIndian Premier LeagueFolake OlayinkaPresident of the United StatesChevy Chase Nkebi nke Ise, MarylandXVideosHJazmine SullivanEbun OniEgedege DanceChristopher MwashingaAsụsụ obodo1998Chelsea EzeNjikọ̀taọ̀hà🡆 More