Orunotu bu Igwe Ozi ma o bu Mashinu ma o bukwanu Sistem (n`olu bekee) nke nwere ike inara ozi (Deta) higharia (prosesi) ya ma buputekwa (autputu) usa (rizootu) ya.
N`ubosi taa, Komputa nwere ike ime ihe ndi ozo di iche-iche dika imeere anyi mgbako na nwepu, igbakoro any otu ubosi siri di (weda), igbakoro any oge (wochi), igbakoro anyi ahia (bizinesi), inya ugbo elu, inya ugbo ala, ma diri gawazie.
Enwere komputa n`udi di kwa iche-iche, dika Elu orunotu, Orunotu akpata, Menframu, Ngügü, Mkpõ, Elekere, Ugbo elu, diri gawa zie. Enwere ike ikewa komputa uzo n`abu dika: HADWIA na SOFTUWIA
Obu otu nwoke onye oke nchoputa aha ya bu Chals Babeji (ing. Charles Babbage) bu onye mbu choputara oke igwe ozi a. Amuru ya na aho 1810, onwuo na aho 1871 n`ala Inglandi. Ochoputara Komputa n`aho 1833. N`ezia Chals bidoro iru oke igwe ozi a, ma obughi ya ruchara n`ikpezu. Obu otutu ndi oke nchoputa ozo so ya n`azu ruputara igwe ozi a n`ikpezu.
This article uses material from the Wikipedia Ìgbò article Orunotu, which is released under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 3.0 license ("CC BY-SA 3.0"); additional terms may apply (view authors). Ọdịnaya dị n'okpuru CC BY-SA 4.0 belụsọ na edere ya otú ọzọ. Images, videos and audio are available under their respective licenses.
®Wikipedia is a registered trademark of the Wiki Foundation, Inc. Wiki Ìgbò (DUHOCTRUNGQUOC.VN) is an independent company and has no affiliation with Wiki Foundation.