John Obi Mikel: Onye otu egwuregwu bọọlụ nke Naijiria

John Obi Mikel (amụrụ na 22 Eprel 1987) bụ onye egwuregwu bọọlụ ọpụrụiche nke Naịjirịa nke na- agba boolu dịka onye mgbachi na etiti ama egwuregwu ndi otu Stoke City na EFL Championship.

John Obi Mikel
John Obi Mikel: Ọrụ klọb, Ọrụ mba ofesi, Ndụ onye ya
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
obodo maka egwuregwuNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoMikel John Obi Dezie
Aha ọmụmụJohn Michael Nchekwube Obinna Dezie
Aha enyereJohn Dezie
aha ezinụlọ yaObi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Eprel 1987 Dezie
Ebe ọmụmụJos Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụicheetiti etiti Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2004 Dezie
Ụcha ime anyaagba aja aja Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie
nọmba egwuregwu12 Dezie
otu egwuregwuPremier League Dezie

John Obi Mikel: Ọrụ klọb, Ọrụ mba ofesi, Ndụ onye ya
Added image

Mikel malitere ọrụ ya na bọọlụ na Plateau United, tupu ọ banye na klọb Lyn Lyn na obodo Norway mgbe ọ dị afọ iri na asaa n’afọ 2004. N’afọ 2006, ka osi soro ndị Chelsea ebe ndị Manchester United kwuru sị na odeba go aha na akwụkwọ ha we'te kwa'ra ihe nnukwu ngbagwoju anya. ọ nọrọ afọ iri na otu na Chelsea, tupu ọ kwaga China ịga gbara ndi Tianjin TEDA bọọlụ n'afọ 2017. Mgbe ọ nọsịrị afọ abụọ na China, ọ laghachiri England na nkwekọrịta nke obere oge ya na ndị Middlesbrough, tupu osonye kwa ndi Trabzonspor na nbugharị nke bu n'efu na July 2019. Mikel laghachiri England na August 2020 isonyere kwa Stoke City. N'ime afọ iri na anọ nke ịgba bọl mba ụwa niile n'agbata 2005 na 2019, ọ gbara bọọlụ oge narị asatọ asatọ maka Nigeria, nye kwa ihe mgbaru ọsọ nke bu ọkpụ gọọlụ isii.

Ọrụ klọb

A mụrụ Mikel na Jos, Plateau State, nwa nke Michael Obi, onye ahia ulo oru ya bu maka ugbo ala nke na'agaba na Jos na mpaghara obodo ahụ. Nna ya bu onye Igbo.

Mikel bidoro ọrụ ịgba bọl ya mgbe ọ dị afọ iri na abụọ mgbe ahọpụtara ya dịka onye egwu bọọlụ site na ụmụaka ruru puku atọ ka osoro na Pepsi Football Academy, otu ama ama na-eme njem gafere Nigeria niile na-enyocha ndị na-eto eto na-egwu egwuregwu bọl maka ịhọrọ ndị na-egosi na ha nwere ike ịji egwuregwu ahụ mee orụ aka ha na ọdi n'ihụ. A chọtara Obi dika onye mara ihe ekwe na akụ, ma emechaa họrọ ka o soru ọgbakọ klọb Plateau United, klọb nke mepụtara kpakpando dị iche iche na mbụ na bọl dịka Celestine Babayaro, Victor Obinna na Chris Obodo, n'etiti ndị ọzọ, ndị nke gara n'ihu na-aga nke ọma na klọb ndị na agba European league.

Emechara mara ya dị ka John Obi Mikel. O mere ihe ejiri mee isi okwu maka obodo ya na FIFA Under-17 World Championships na obodo Finland. Mgbe asọmpi ahụ gasịrị, ọ gara n'ihu isoro nyocha maka ndị klọb Ajax Cape Town, na South Africa, ka ọmesia, o sonyere otu di na obodo Oslo nke ana akpọ Lyn Fotball n'ime mba Norway.

N'oge nkwadebe maka asọmpi iko ụwa nke FIFA na-eme na afọ iri na atọ (2003), ndị otu egwuregwu bọọlụ Nigeria (NFA) nyefere aha dika "Michael" kama "Mikel" maka asọmpi ahụ na Finland. O kpebiri idobe aha ọhụrụ ahụ, ma kwuo si na ọ nwere "ka osi ada pụrụ iche." Na 31 Julaị n'afọ 2006, o kwuru na ọ họọrọ ka akpọ ya Mikel John Obi kama ịbụ John Obi Mikel, dịka a na-akpọkarị ya.

N'oge ọkọchị nke 2005, Mikel gbara bọl n'aha Nigeria na asọmpi FIFA World Youth Championship nke e mere na Netherlands. Asọmpi ahụ dabara mba Naịjirịa tupu oge ikpeazụ, mgbe ndi mba Argentina meriri haa 2-1. Obi nwetere nturu ugo bọọlụ ọlaọcha maka a họpụtara ya dika onye ọkpụkpọ nke abụọ kachasị mma na sọmpi ahụ.

Nyefee gaa na England

Na 29 Eprel 2005, ụbọchị ole na ole mgbe Mikel gbara afọ 18, otu klọb na Premier League - Manchester United kwupụtara na ya na Lyn bịanyere aka n'akwụkwọ iji kpọrọ Obi. Webụsaịtị United weputara na ha na Obi kpara nkata maka abịanye aka na nkwekọrịta isonyere ha. Obi etinyeghị ndị nnochita anya nya na ịgba ịzu ahụ nke mere ha ji du ba ya na nkwekọrịta nke ga eke chiya maka afo anọ. Eboro ebubo na ndi Lyn zigara ndi nnochi anya na mba ofesi akwụkwọ, na-ekwu na Mikel anọghọ zikwa ha na aka ma'ọbu achọ ọrụ ha. Akụkọ kwuru na nkwekọrịta ahụ ruru nde pounds anọ na mbido, tinyere ime ka Obi bido ọrụ na Old Trafford na Jenụwarị 2006.

Otu egwu bọọlụ na Premier League ha na Manchester United na ekwo ekworo bụ Chelsea, mechara nye nzaghachi na-ekwu na ha na Mikel na ndị ọrụ ya enwela nkwekọrịta, mana Lyn gọnarịrị nkwupụta a. Agbanyeghị nkaa, akụkọ mechara gosi na Chelsea kwuru na ọ banyere na ịhazi kaa Obi si were gaa Europe na oge mbụ maka ịmecha soro klọb ahụ. A tinyekwara ihe ọzọ na nkwupụta a mgbe ekpughere na egwuregwu Obi masịrị onye isi Chelsea José Mourinho mgbe ọ na-azụ ndị otu egwuregwu n'oge ọkọchị nke 2004.

Mikel gosiputara obi uto ya iso United na nzuko ndi nta akukọ mere ngwa ngwa hazia, ebe ese ya dika o jigide uwe Manchester United nke bu akara ndi otu ahụ 21. Mgbe ọ bịanyere aka na nkwekọrịta iji sonye United, a na-ekwu na Norway na ọ natara ọtụtụ oku ekwentị nmaja site na ndị amaghị. E kenyere Mikel onye na-eche ya nche ma kwaga na họtel dị iche maka nchekwe. Agbanyeghị nkaa na 11 Mee 2005, Obi bu onye furu efu n'oge egwuregwu bọọlụ Norwegian Cup ana agba megide Klemetsrud. Ahọpụtaghị Obi maka egwuregwu ahụ kama ọ nọ na-ele bọl ahụ na ama egwuregwu.

Ụfọdụ ndị mmadụ chere na onye nnochita anya ya John Shittu, onye nke batara obodo ahụ ihu Obi bukwa onye zuru ya wee pụọ n’ámá egwuregwu ahụ. Mana ofufu ahụ mere ka enwe nnukwu mkpọtụ na Norway ma kpalite, kpasuo oke nyocha ndị uwe ojii mgbe onyeisi Lyn, Morgan Andersen kwupụtara ndị mgbasa ozi Norway na "a tọọrọ la Mikel". Onye na-esote onye nchịkwa Manchester United Carlos Queiroz mechara kwughachi nkwupụta ndị a, na ebo Chelsea ebubo na ọtinyere akana "ebubo ntọ Mikel ".

Ọmecha achọpụta na Mikel gara London yana onye nnochi anya ya John Shittu, bụ onye na-arụ ọrụ maka otuJerome Anderson 's SEM. Onye isi nchịkwa Manchester United Alex Ferguson tụlere ịgaru Oslo ịga leta Mikel, mana kpebiri megide nke a mgbe a kọchara na Mikel hapụrụ obodo ahụ.

Mikel nọrọ n'ụlọ nkwari akụ ụbọchị itoolu tupu ọ pụta na ajụjụ ọnụ na Sky Sports News. Ọ sịrị na akwagidere ya maka ịbanye na nkwekọrịta ya na United mgbe onye nnochi anya ya anọghị ya. Ọ ji kwa iwe kwuo na akụkọ ndị Manchester United na Lyn na akọ bu akụkọ ịgha ụgha.

Mikel gwara ndị mgbasa ozi Britain na Chelsea bụ klọb ọ chọrọ ịbịanye aka n'ezie maka igba bọl. Na nzaghachi na ihe omume ndị a, United mere mkpesa na FIFA banyere omume nke ndị Chelsea ma ndị nnọchi anya ahụ, Shittu na Rune Hauge, ndị ama ama maka ajọ ọrụ ha na akụkọ egwuregwu ihe gbasara George Graham . FIFA nyocha ma wepụ ebubo nkwupụta ndị a na August 2005, na-ekwupụta na enweghị akaebe zuru ezu iji weta ikpe megide Chelsea.

Mgbe asọmpi ahụ gasịrị, Mikel ekweghị alaghachi Lyn, nke mere klọb ahụ jiri gaa kpesa ya na FIFA. Na 12 August 2005, FIFA kpebiri na Mikel ga-alaghachi Lyn iji mezuo ihe ndị ọzọ ọ nwere na nkwekọrịta ya na klọb ahụ, ebe ha ga-ekpebi ụbọchị ọzọ ka ọ ga akwadoro ma ọ bụ kagbuo nkwekọrịta ya na United. Mgbe ogasịrị nke ihe karịrị otu ọnwa, Mikel gbasoro mkpebi FIFA wee laghachi Lyn na mbido Septemba 2005 mgbe ọ gụsịrị ọnwa atọ ọhapụrụ ha.

Ndozi nsogbu nyefe nke ahụ

Kama ịhapụ FIFA iji chọpụta eziokwu ihe gbasara nkwekọrịta nke Manchester United bịanyere aka, Chelsea gbabatara site na ị wepụta onwe ya iji dozie ọnọdụ mbufe ahụ site na mkparịta ụka ha na Lyn na Manchester United.

Na 2 June 2006, Chelsea, Manchester United na Lyn rutere mkpebi iji dozie ọdịnihu Mikel. Ekwetara ka ndebanye aha Mikelsi na Lyn gaa Chelsea; Manchester United kwenyere ịkwụsị nkwekọrịta nhọrọ ha na Mikel. N'okpuru usoro nkwekọrịta a, Chelsea kwetara ịkwụ United nde pounds iri na abụọ, ọkara nke aga akwụ mgbe mmecha nkwekọrịta ahụ na ọkara nke ọzọ na June 2007. Ha kwenyere kwa'ra ikwụ Lyn nde pounds anọ, ọkara ịkwụ ozugbo na ọkara na June 2007. N'ihi ndozi a, wepụrụ nkwupụta niile dị n'okwu a. Na 19 Julaị 2006, enyere Chelsea ikike ịrụ ọrụ maka Mikel ka ha kwụchara nde poundsiri na isii maka n'bịanyere aka na June 2006.

Mgbe nnyefe ahu gachaa, onyeisi Lyn Director Morgan Andersen, onye ama buru ikpe maka ideghari akwụkwọ gọọmentị na n'ụzọ adịghị mma, ka ejide ọzọ makwa ya ikpe maka wayo na-ebo ebubo ụgha; ụlọ ikpe Oslo nyere ya ikpe otu afọ. Ụlọ ikpe ahụ nyekwara ya iwu ka ọ kwụọ puku iri abụọ kroner nke pụtara pounds otu puku, narị iteghete na anọ na ụgwọ. Chelsea gbara akwụkwọ n'ụlọ ikpe dị elu maka nde pounds iri na isii megide Lyn na Andersen na nsochi nkwenye ahụ, na-ekwu na ego ekwere ikwụ maka n'dozi nkwekọrịta ahụ na mbụ ejikọtaghị ya ọzọ maka "nnyefe ahụ sitere na nkọwa ụgha nke ụlọ ikpe iwu gosipụtara ugbu a." E mechara kpebie nkwupụta a n'azụ n'ụlọ ikpe.

Chelsea

Oge bọl 2006–07

Na 12 Septemba 2006, Mikel mmalite igba bọl izizi ya na Chelsea na UEFA Champions League megide ọgbakọ Bulgaria Levski Sofia wee gbaa otu bọl mgbaka sịrị ike nke onye mgbaru ọsọ ahụ na-azọpụtaghị ya nke mere Didier Drogba were dozie ma sụnye bọl ahụ. Mikel natara ọtụtụ nkọwa dị mma maka arụmọrụ ya na egwuregwu ahụ. Agbanyeghị nkaa, ebe ọ bụ na ezipụrụ ya na egwuregwu megideebe ndi Reading F.C na 14 Ọktoba 2006, Chelsea tara ya ahụhụ ugboro atọ site na Chelsea maka ịlaghachi azụ na mgbe oge ọzụzụ.

N'oge ahụ, a kwenyere na onye njikwa Chelsea bụ José Mourinho nwere mgbaru obi banyere ụdị ndụ ọ na-ebi na mpụga na ama egwuregwu Stamford Bridge, a kọkwara na klọb ahụ na-atụle ịhapụ onye ahụ maka nkea. Agbahapụrụ Mikel ihe karịrị otu ọnwa. N'oge ahụ nna ya Michael kwupụtara na uche n'echegbu ya banyere akparamàgwà nwa ya nwoke. Ka emechara, akpo hachiri Mikel azụ na egwuregwu Chelsea gbara na Champions League nke ha na otu egwuregwu Werder Bremen gbaa na ebe abughi Stamford bridge na ụbọchị 23 na ọnwa Nọvemba n'afọ 2006.

Ọ mere ihe mgbaru ọsọ mbụ mgbe ọsunyere otu ọkpu ya ka Chelsea na agba FA Cup ha na Macclesfield Town na 6 Jenụwarị 2007 nke mere Chelsa ji nwe mmeri 6-1 na egwuregwu ahụ. Ọ sunyere ihe mgbaru ọsọ ọkpu ọzọ ka Chelsa gbara ndị Nottingham Forest na asọmpi nke na-esote. N'oge Chelsea mmeri na egwuregwu ikpeazu League Cup na 2007, e zipụrụ Mikel na oge mmerụ ahụ (ọ bịara dị ka onye nọchiri anya na egwuregwu ahụ) mgbe nya na Kolo Touré kwakoritaa na'ama bọọlụ. Ka nkea mere, enwere nnukwu nsogbu, nke mere eji wepụ Touré na Emmanuel Adebayor nke Arsenal, ebe edere aha Cesc Fàbregas na Frank Lampard ka ndị dara iwu, ebe Mourinho na Arsène Wenger na-ese okwu na akụkụ ama egwuregwu ahụ.

N’egwuregwu ndị na-esote, Mourinho tinyere Mikel dị ka onye mbido na egwuregwu na jigide ebe ọ gosiri nmasị nke ukwuu, ọkachasị na egwuregwu Chelsea – Tottenham Hotspur FA Cup n'agba nke isii, na asọmpi Champions League nke ikpeazụ megide Valencia, na nke Champions League ọkara egwuregwu ikpeazụ megide Liverpool na kwa mmeri 2007 FA Cup Final megide Manchester United. Ogologo Mikel toro na ike dị ya na ukwuu, tinyere uzo di'egwu osi ejikwa bọl ọfụma na-agafe ndị ọzọ nke na enye aka aghasa na meghasị ndị otu ha na ya na agba bọl, ma na-enye ndị otu ya ohere igba bọl site na ịgbasa egwuregwu bu ihe ịtu na'anya nke ọma. Mikel weghara ọkwá onye France bụ Claude Makélélé mgbe ọ mgbe ọ pụrụ gaba Paris Saint-Germain .

Oge bọl 2007–08

Ezipụ Mikel maka oge nke atọ na ọrụ ya na Septemba 2007, mgbe onye ọka ikpe na egwuregwu bọl Mike Dean wepụrụ ya maka ịlụ ọgụ megide onye nchịkwa Manchester United Patrice Evra. Chelsea tinyere akwụkwọ megide mgbochi maka ịgba bọọlụ ahụ, mana a na-akwado mmachi ahu enyere Mikel maka igba bọọlụ ugboro atọ.

E zipụrụ Mikel na ọkara nke League Cup megide Everton maka ịma aka nke na adabaghị ọ mara Phil Neville . N'agbanyeghi nke a, ọ laghachitere n'ike na oge bọl abụọ dị mma maka ya na Chelsea.

Oge bọl 2008–09

John Obi Mikel: Ọrụ klọb, Ọrụ mba ofesi, Ndụ onye ya 
Mikel na-egwuru egwu Chelsea megide Spartak Moscow

Oge ọkọchị nke afọ 2008 aka ochie na bọl Claude Makélélé gara na klọb ndị French Paris Saint-Germain, ma hapụ ohere na ọkwá nke onye na-agbachi n'etiti na ama bọl. N'ime oge bọọlụ niile nke 2008–09, Mikel nwere ezigbo ohere igba egwuruegwu ahụ n'ihi mmerụ ahụ Michael Essien merụrụ. N'ime oge ahụ, Mikel rụrụ ọrụ nke ọma na akụkụ ọrụ ya niile. Onye njikwa Chelsea Luiz Felipe Scolari toro egwuregwu ya na-ewuli elu na oge a. Ogosipụtara oke mkpa odị mgbe ọ nyere bọọlụ efu nke Salomon Kalou gbaa nwe nye Manchester United otu ọkpụ nke mere ha ji nwee ihe nhara ịha na otu egwuregwu. Ọ gbara ezigbo bọọlụ na oge 2008–09 nke mere na a họpụtara ya ka onye mbụ n'etiti nha nha na-eto eto na klọb nke oge ahụ. N’ụbọchị iri abụọ na anọ n’ọnwa Jenụwarị 2009, e boro Mikel ebubo drunk driving, nke ahụ bu ịna-akwọ ụgbọala mgbe mmanya na-egbu ya. Ihe nkea mere dị ka awa ole na ole tupu egwuregwu FA Cup Chelsea na Ipswich Town – agbanyeghị na Mikel esoghị na-egwu egwuregwu ahụ maka ọ nọ ntaramahụhụ nke nkwụsị bọọlụ na oge ahụ. .

Oge bọl 2009-10

John Obi Mikel: Ọrụ klọb, Ọrụ mba ofesi, Ndụ onye ya 
Mikel na-egwuru egwu Chelsea megide Fulham na ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Disemba, 2009.

N'ọnwa Febụwarị, ụbọchị iri na atọ, n'afọ 2010, Mikel nyere Didier Drogba bọọlụ onye gbanarị David Marshall na ọsọ wee sunye otu ọkpụ ka Chelsea meriri Cardiff City 4-1 na iko FA Cup na agba nke ise. Mikel nyere aka ọzọ maka otu ihe mgbaru ọsọ nyekwa Drogba na mmeri 5-0 meriri ndị na-asọmpi iko FA na Portsmouth na March 24. Mikel gbara nkeji iri itoolu na iri iteghete mgbe Chelsea ji 7-1 merie Aston Villa ụbọchị atọ ka nke ahụ gasịrị ka Chelsea na-agba ọsọ imeri na Manchester United na egwuregwu Premier League. N'egwuregwu Premier League ha na-esote United, Mikel egwuri egwu bọọlụ dị ka nnukwu mmọnwụ na midfield ka Chelsea na-agbago n'elu United na tebụl nke ngosi mmeri 2-1 na Old Trafford, site na ihe mgbaru ọsọ Joe Cole na Drogba.

N'okpuru onye isi ọhụụ Carlo Ancelotti, Mikel gara n'ihu na-arụ ọrụ nke ọma na ọrụ ịgba bọl nke mere na ọ pụtara gbara ndi klọb ya bọl ugboro iri atọ na ise. Na Mee 2010, ọ nwetara ihe nrite Premier League na FA Cup nke ndị mmeri dịka onye nke otu egwuregwu Chelsea nke nwere mmeri okpukpu abụọ nke mbụ na mbụ.

Oge bọl 2010–11

Mikel gbara bọl nke ọma na Chelsea na Premier League oge nke 2010–11 Mikel gba zuru oge bọl niile ma nyere aka ime na egwuregwu atọ ndị mbụ ka Chelsea gbara diégwu ebe emeriri West Bromwich Albion 6-0 na 14 Ọgọst, merie Wigan Athletic 6-0 na DW Stadium ka ụbọchị asaa gasịrị ma tinye egwu n’ahụ Stoke City 2-0 na 28 Ọgọst.

Mikel bụ onye a họọrọ karịa n'ịgba bọọlụ dịka onye otu egwuregwu nchekwa nétiti egwu egwuregwu n'ihi na Michael Essien nọrọ ọtụtụ oge na agbaghị bọl maka mmerụ ikpere. Ihe mmerụ ahụ nke Essien mere ka klọb ahụ nwee ike itinye akara ọhụụ ha nwetara nke bu Ramires otutu oge. Mikel gbara bọọlụ iri abụọ na asatọ na egwuregwu Premier League n'aha ndị Chelsea ka ndị otu London ahụ kwụsịrị n'ọkwa nke abụọ, pointị isi itoolu n'azụ ndị Manchester United bụ ndị isi. Maka na klọb Chelsea apụtaghị mbụ na Premier League, ha chụrụ onye njikwa ha bu Carlo Ancelotti

Oge bọl nke 2011–12

Tupu mmalite nke Premier League na oge a, a tọrọ nna Mikel na ala nna ya bu Nigeria na 10 August; n'agbanyeghị nke a, Mikel sonyere na malitere mmeghe ọgbakọ ahụ na bọl Chelsea na Stoke City na Britannia Stadium. Mikel gbara bọl di'egwu na ọfọdu ntakiri ihe ka onye goal na egwuregwu ahụ nke di ọku na ụzọ puruiche na. Egwuregwu ahụ bu nke mbụ onye nkuzi André Villas-Boas na-elekọta biri na 0-0.

N'ihi mmerụ ahụ ikpere Essien ruo ogologo oge, Mikel chọtara oge egwuregwu karịa, mana n'oge oge ekeresimesi ọ nwere ohere iji mịnye aha ọhụụ Oriol Romeu . Esonụ a na-agba ọsọ nke na-akụda fixtures, gụnyere a kpata ajọ 3-1 ọnwụ ka Napoli na -agbachitere Njikọ gburugburu nke 16 mbụ ụkwụ na a 1-0 mmeri na West Brom, Villas-Boas a Sacked site Chelsea nwe Roman Abramovich . N'ime egwuregwu abụọ a, Mikel bụ onye edochi anya Blues. Na-esochi nhọpụta onye bụbu onye Chelsea bọọlụ Roberto Di Matteo dị ka onye nkuzi oge, Mikel pụtara na 16 n'ime klọb iri abụọ gara aga wee bido na 14 n'ime ha, wee malite igwu ụfọdụ bọl bọọlụ kachasị mma maka klọb ahụ.

Mikel gbararụrụ bọl nkeji iri itoolu zuru ezu na mmeri 2-1 nke Chelsea meriri Liverpool na FA Cup Final na May 5 na 2012, mana ọnwere kaadị edo edo na nkeji nke 36. Premier League nke 2011-12 hụrụ ka Mikel pụtara na bọl ụgboro iri abụọ na abụọ, bido n'ime egwuregwu iri na ise, maa gbakwa bọọlụ ụgboro asatọ maka n'duga n'usoro otu ahụ na 2012 UEFA Champions League Final na Bayern Munich .

Na egwuregwu nke ikpeazụ na Munich na Mee 19, Mikel gbara nkeji otu narị na iri abụọ mgbe ọgụ nke otu abụọ ahụ butere ha ịgba 1-1. Chelsea lụrụ ọgụ siri ike na onye ọrụ Sky Sports nke bu Jamie Redknapp siri na MIkel gosipụta na ọ na-egwu egwuregwu dị mma, maa tinye "arụmọrụ ndiche nke'm echeghị na ọ nwere, na-agbanyụ ọkụ ebe niile na egwuregwu ahụ" Chelsea mecha nwe mmeri 4-3 site na na ntaramahụhụ penaltị. Ka agbara chara bọọlụ ahụ di oke egwu, Mikel gwara ndị nta akụkọ na ọ bụ "abalị kachasị mma na ndụ anyị ." Ọrụ dị egwu Mikel rụrụ na ngwụcha nke oge a na nnukwu ihe ọ mere mgbe Chelsea gbaa na Munich nyeere Chelsea aka ịnọ ná enweta ohere na asọmpi Champions League na afọ ọzọ na-agbanyeghị na ha gbara onye isii, mekwa ndị Tottenham banye na UEFA Europa League .

Oge bọl 2012–13

Mikel bidoro egwuregwu ise ndị mbụ nke Chelsea na e oge ọhụụ Premier League nke 2012 - 13, yana asọmpi nke Community Shield megide Manchester City na Super Cup megide Atlético Madrid . N’ọnwa Nọvemba, aha Mikel dị na ndepụta ọkpụkpọ nke African Footballer of the Year ya na Didier Drogba onye otu Chelsea na oge garaaga.

John Obi Mikel: Ọrụ klọb, Ọrụ mba ofesi, Ndụ onye ya 
Mikel na akwado egwuregwu megide Roma na August 2013.

Ndi Football Association (FA) boro Mikel ebubo omume ojoo mbọchị 22 November 2012. E nyere ya mmachibido egwuregwu atọ ya na ụtụ £60,000 ntaramahụhụ maka onye ọka ikpe Mark Clattenburg ọkpari ma gwakwuo ajo okwu mgbe Chelsea meriri Manchester United.

Na 5 Disemba 2012, Mikel na Chelseas bịanyere aka na nkwekọrịta nke iji debe ya na klọb ahụ ruo n'afọ 2017.

Oge bọl 2013 –14

John Obi Mikel: Ọrụ klọb, Ọrụ mba ofesi, Ndụ onye ya 
Mikel na-egwuru egwu bọl na Chelsea n'afọ 2013

Na 21 Septemba 2013, Mikel gbara ihe mgbaru ọsọ Premier League nke mbụ mgbe ha mmeri Fulham 2-0. Ọ gbara ihe mgbaru ọsọ nke abụọ n'oge ahụ na agba nke atọ nke Chelsea na Derby County na mbọchị 5 Jenụwarị 2014. Ihe mgbaru ọsọ Mikel mmeghe ndị Chelsea ụzọ na mmeri nke 2-0. O mezuru ụgboro narị abụọ ọ gbara ndi Chelsea bọl na Premier League na ụbọchị nke atọ nke ọnwa Febụwarị, mgbe ọ bata na ama egwuregwu ka onye nnochi anya mgbe ha gbara ma merie Manchester United 1-0 na bee ndị ahụ.

Oge bọl 2014–15

Na 30 Ọgọstụ 2014, ewere Mikel mee onye nọchiri anya Willian na nkeji iri asaa na ise. Ngwangwa Mikel guzobere ihe mgbaru ọsọ nke abụọ nke Diego Costa mgbe ọ gbachiri bọọlụ azụ nke Muhamed Bešić . Chelsea gara n'ihu merie 6-3 megide Everton na Goodison Park . Mikel gbara ihe mgbaru ọsọ pụrụ iche megide Sporting CP na 10 December wee sorokwa nye Chelsea mmeri 3-1 na Stamford Bridge na egwuregwu 2014-15 Champions League .

Oge bọl 2015–16

Mgbe Chelsea na agba egwuregwu megide Watford na mbọchị Boxing Day 2015, na egwuregwu mbụ nke Guus Hiddink bu onyenchịkwa, Mikel bịara bụrụ onye iri abụọ na otu gbara goro Chelsea bọl ugboro narị atọ na iri ise. Mgbe ahụ Chelsea na Paris Saint-Germain gbara bọl na ụkwụ mbụ nke asọmpi UEFA Champions League nke otu 16. Mikel zutere nzuzu dị nnọọ n'ihu igbe 18 ya. Naanị nkeji ole na ole ka nkea mesịrị, Mikel kwụrụ ụgwọ site na ime ka Chelsea sunye otu ọkpụ. N'ihi mmerụ ahụ John Terry na Gary Cahill, Mikel gbara bọ dịka onye na-echekwa etiti n'etiti ọtụtụ egwuregwu.

Oge bọl 2016 –17

Na 4 November 2016, a mara ọkwa na klọb ahụ agaghị emezigharị nkwekọrịta yana Mikel mgbe ọ gwụsịrị na njedebe oge bọl.

Tianjin TEDA

Na 6 Jenụwarị 2017, klọb bọọlụ na China Tianjin TEDA na Mikel bịanyere aka na ịnyefe n'efu. Na 14 Eprel 2018, Mikel gbara ihe mgbaru ọsọ nke abụọ ya maka Tianjin megide Guangzhou R&F . Ọ hapụrụ Tianjin TEDA na njedebe nke oge 2018 Chinese Super League na November 2018.

Middlesbrough

Mgbe Mikel nọchara afọ abụọ na China, o sonyeere ndị klọb na English Championship bu Middlesbrough maka ịnọ obele oge. Ọ dị afọ iri atọ na otu mgbe ahụ ma bụrụ onye nweere onwe ya mgbe ọ hapụchara mpaghara Tianjin TEDA . Mikel gbara bọọlụ ugboro iteghete ma nye nani otu mgbaru ọsọ mgbe Boro na Rotherham United nwere egwuregwu na 5 Mee 2019. Ndị Middlesbrough wepu ya na ngwụcha oge 2018-1919 .

Trabzonspor

N'oge ọkọchị nke afọ 2019, Mikel sonyeere Trabzonspor na nkwekọrịta afọ abụọ yana nhọrọ nke afọ ọzọ

Ekwuputara ya na 17 Mach 2020, na Mikel hapụrụ Trabzonspor site na nkwenye n'etiti ndị klọb na ya onwe ya, ka o kwupụtachara nchegbu ya banyere Turkish Super Lig na-aga n'ihu na ajọ ọrịa zuru ụwa ọnụ bu COVID-19.

Stoke City

Mikel bịanyere aka nkwekọrịta otu afọ otu ya na otu EFL Championship, Stoke City na 17 Ọgọst 2020.

Ọrụ mba ofesi

John Obi Mikel: Ọrụ klọb, Ọrụ mba ofesi, Ndụ onye ya 
Mikel na - egwuri egwu maka Nigeria megide Iran na 2014 FIFA World Cup

Mikel nọchitere ndị otu Naịjirịa na-erughi 20 na 2005 FIFA World Youth Championship ma merie ọla ọcha maka onye ọkpụkpọ kachasị nke abụọ na asọmpi ahụ (n'azụ Lionel Messi ) ka ndị Naịjirịa gbara ndị onye nke abụọ na esote Argentina .

O gbara egwuregwu nke mbụ maka ndị otu isi Nigeria na 17 August 2005, mgbe ọ batara dị ka onye nnọchi nke abụọ nke ọkara na asọmpi enyi na enyi megide Libya . Ọ gbaghị bọọlụ ọzọ tupu a kpọọ aha ya na ndị otu maka asọmpi Africa Cup of Nations nke 2006 . N'egwuregwu mbụ nke Nigeria, megide Ghana, Mikel bụ onye nnọchi mana a kpọ bata ghị ya. Agbanyeghị nkaa, etinyere ya n'ime egwuregwu nke abụọ megide Zimbabwe n'isi ọkara nke abụọ. N'ime nkeji iri ọ batara, ọ gbara bọl site na akụkụ isi abụọ nke nyere Christian Obodo aka ka o sunye ọkpụ abụọ ya bu ihe mgbaru ọsọ abụọ maka Nigeria. Mikel soro na mbido egwuregwu nke mba ụwa mbụ na egwuregwu Naịjirịa na Senegal nke ndi otu Mikel nwere mmeri 2-1.

John Obi Mikel: Ọrụ klọb, Ọrụ mba ofesi, Ndụ onye ya 
Mikel soro Nigeria na 2017

N’afọ 2007, a kwụpụrụ Mikel site na ndị otu na gbara Naịjirịa bọl megide ndị mba ofesi mgbe onye njikwa Berti Vogts tụpụrụ Mikel na ndị otu egwuregwu maka asọmpi iAfrican Cup of Nations qualifier megide Niger maka ọbiaghị egwuregwu nke mbụ ha mere megide Uganda . Mikel kọwara na ọbu mmerụ ahụ kpatara nka, mana n'ihi na ọ gaghị nyocha ndị nweere onwe nke ndị ọrụ ala Nigeria, ekweghị akụkọ ya. Nke a, na otú ọsiri jụụ igba bọl maka otu ndị n'erubeghị afọ iri atọ na Nigeria , mere ka enye ya na ya nkwusioru site n'aka Nigeria Football Federation . Mgbe ọ rịọrịrị mgbaghara, agbaghara ya maa kpọọ ya ka ọ bịa soro na ndị otu egwuregwu maka asọmpi Africa Cup of Nations nke 2008 na Ghana . N'ime asọmpị ahụ, ọ gbara otu ihe mgbaru ọsọ ma nyere aka na otu egwuregwu megide Benin iji nyere Nigeria aka iru eru maka asọmpị nke asatọ megide Ghana ndị nwere mmeri 2-1 megide Mikel na ndị otu ya.

John Obi Mikel: Ọrụ klọb, Ọrụ mba ofesi, Ndụ onye ya 
Mikel gbara Nigeria megide Iceland na FIFA FIFA World 2018

Akpọ Mikel maka igba bọl nke ndị n'erubeghị afọ iri atọ maka njikere nke otu ahụ na egwuregwu ikpeazụ Olympic nke ha nwere na 26 March 2008. Ọ bịaghị maka bọọlụ ọ bụla chaa chaa. Nke a wetara mkpọtụ na mgbagha na ebe onye nkuzi otu U23 Samson Siasia nọọ, onye tụpụrụ ya n'egwuregwu Olympic n'etiti ọgba aghara dị egwu nke ndị mgbasa ozi ekwu okwu maka ya.

Na 5 June 2010, Mikel apụtaghị na FIFA World Cup na South Africa 2010 n'ihi mmerụ ahụ ọ nwere. Ọ nọ na-agbasi mbọ ike ka ọ gbakee site na nsogbu ikpere nke ọwachara ya na May. Ma na a kọọrọ akụkọ na na-ekwu na mmerụ ahụ nkwonkwo ụkwụ bụ ụta maka nke ahụ.

N'oge asọmpi Africa Cup of Nations nke 2013, Mikel bụ nnukwu onye isi ọkpụkpọ maka Nigeria na egwuregwu ahụ. Ndi Confederation of African Football (CAF) kpọrọ ya aha n'ime ndị otu egwuregwu ahụ n'etiti ndị otu egwuregwu ndị ọzọ dịka Vincent Enyeama, Efe Ambrose, Victor Moses na Emmanuel Emenike .

Mikel gbara egwuregwu FIFA World Cup nke mbụ ya na asọmpi 2014 na Brazil, wee nweta nturu ugo ka nwoke nke egwuregwu ahụ na bọọlụ nmepe Super Eagles gbara Iran ma nyere ndị otu ahụ aka iru ọkwa nke mbụ ya kemgbe 1998.

Ndị Nigeria họpụtara ya maka ndị otu mmadụ iri atọ na ise ga-eme agba egwuregwu maka asọmpi nke oge ọkọchị na2016 , emesia akpọ ya onye isi ndị otu egwuregwu Olympics . Na 13 Ọgọst 2016, Mikel tinyere ihe mgbaru ọsọ mbụ ya n'egwuregwu Olympic na mmeri nke 2-0 megide Denmark iji gafere na ọkara ikpeazụ. Mgbe ahụ emeriri Germany na 2-1, Nigeria gara n'ihu na asọmpi ọla kọpa megide Honduras . Na 20 August, Mikel nyeere Nigeria aka inweta ọla nze atọmge ha meriri Honduras. Naịjirịa ghọrọ obodo mbụ ritere mmeri atọ n'egwuregwu Olympic - ndị otu egwuregwu 1996 nwere mmeri ọlaedo, ma ndị otu 2008 wee nweta ọla ọcha na asọmpi Olympics.

N'ime asọmpi iko mba ụwa FIFA nke 2018 megide Algeria, Mikel gbara otu mgbaru ọsọ wee nyere onye otu Chelsea ibe ya aka bụ Victor Moses na mmeri 3-1.

Na July 2019, o kwuru na iko mba Afrịka nke 2019 ga-abụ asọmpi ikpeazụ ya maka Naịjirịa. Ọ lara ezumike nka na ngwụcha asọmpi a, nke Naịjirịa bịara nke atọ.

Ndụ onye ya

Na 12 August 2011, nna Mikel, Michael Obi bụ onye a na-enyo enyo na a tọọrọ na Nigeria. A gwara Mikel tupu egwu bọọlụ Chelsea na Stoke City ụbọchị abụọ ka nke ahụ gasịrị, ọ họọrọ igwu egwu n'agbanyeghị nchegbu o nwere maka ọdịmma nna ya. Na 15 August 2011, Mikel rịọrọ arịrịọ maka nna ya laghachite n'udo. Ọ gwara ndi Sky Sports News, "Agbalịwo m mgbe niile inyere obodo'm aka, nke a bụ oge obodo ga enyere m aka, onye ọ bụla maara ebe ha roro nna m, biko ya kpọtụrụ m." A hụrụ Michael Obi na ndụ na 22 Ọgọstụ 2011, n’obodo Nigeria na mpaghara Kano. A kọrọ na aka ndị uwe ojii akpara go ndị n'tọọrọ ahụ. Na 26 June 2018, awa ole na ole tupu egwuregwu FIFA World Cup, a gwara Mikel banyere n'nwude Michael Obi ọzọ, ma ọ gwaghị onye ọ bụla so n'òtù egwuregwu ahụ. Ndị uwe ojii Enugu steeti kwuru na ha napụtara Michael Obi na abalị abụọ nke ọnwa Juun mgbe akawasịrị agha mgbọ.

Ndekọ ọnụ ọgụgụ ọrụ

Klọb

Appearances and goals by club, season and competition
Club Season League National Cup League Cup Europe Other Total
Division Apps Goals Apps Goals Apps Goals Apps Goals Apps Goals Apps Goals
Lyn 2004 Tippeligaen 4 0 0 0 4 0
2005 Tippeligaen 2 1 0 0 2 1
Total 6 1 0 0 6 1
Chelsea 2006–07 Premier League 22 0 6 2 4 0 9 0 1 0 42 2
2007–08 Premier League 29 0 2 0 3 0 4 0 1 0 39 0
2008–09 Premier League 34 0 5 0 1 0 9 0 49 0
2009–10 Premier League 25 0 3 0 2 0 4 0 1 0 35 0
2010–11 Premier League 28 0 2 0 0 0 6 0 1 0 37 0
2011–12 Premier League 22 0 5 0 1 0 9 0 37 0
2012–13 Premier League 22 0 3 0 1 0 9 0 3 0 38 0
2013–14 Premier League 24 1 2 1 2 0 7 0 1 0 36 2
2014–15 Premier League 18 0 2 0 4 0 2 1 26 1
2015–16 Premier League 25 0 2 0 2 0 4 1 0 0 33 1
2016–17 Premier League 0 0 0 0 0 0 0 0
Total 249 1 32 3 20 0 63 2 8 0 372 6
Tianjin TEDA 2017 Chinese Super League 13 1 0 0 13 1
2018 Chinese Super League 18 2 0 0 18 2
Total 31 3 0 0 31 3
Middlesbrough 2018–19 EFL Championship 18 1 1 0 0 0 19 1
Trabzonspor 2019–20 Süper Lig 19 0 0 0 0 24 0
Stoke City 2020–21 EFL Championship 0 0 0 0 0 0 0 0
Career total 323 6 33 3 20 0 68 2 8 0 452 11

Ofesi

Ọdịdị na ihe mgbaru ọsọ nke otu mba na afọ
Ndi otu mba Afọ Mputa Ihe mgbaru ọsọ
Naịjirịa 2006 5 1
2007 4 0
2008 8 1
2009 5 0
2010 8 0
2011 8 0
2012 2 1
2013 17 1
2014 13 0
2015 3 0
2016 5 1
2017 4 1
2018 5 0
2019 4 0
Ngụkọta 91 6

Ihe mgbaru ọsọ dị n’agbata ụwa

    Ntinye akara na nsonaazụ edepụtara maka ihe mgbaru ọsọ na egosi Nigeria na mbụ.
Ee e. ụbọchị Ebe Onye iro Akara N'ihi Asọmpi
1. 27 Jenụwarị 2006 Egwuregwu Port Said, Port Said, Egypt Ndị Zimbabwe 2 –0 2–0 Afọ 2006 Mba Ndị Africa
2. 29 Jenụwarị 2008 Ebe egwuregwu Sekondi-Takoradi, Sekondi-Takoradi, Ghana Benin 1 –0 2–0 Afọ 2008 Africa Cup of Nations
3. 13 Ọktoba 2012 UJ Esuene Stadium, Calabar, Nigeria Liberia 4 –1 6–1 Asọmpi Iko Mba Afrịka nke 2013
4. 20 June 2013 Itaipava Arena Fonte Nova, Salvador, Brazil Urugueka 1 –1 1-2 2013 FIFA Confederations Cup
5. 12 Nọvemba 2016 Godswill Akpabio International Stadium, Uyo, Nigeria Algeria 2 –0 3-1 Asọmpi iko mbaụwa nke FIFA 2018
6. 1 Septemba 2017 Kameruun 2 –0 4–0

Nsọpụrụ

Chelsea

  • Premier League : 2009–10, 2014–15
  • Iko FA : 2006–77, 2008–09, 2011–12
  • Iko Njikọ bọọlụ : 2006-07
  • FA Community Shield : 2009
  • UEFA Champions League : 2011–12
  • UEFA Europa League : 2012–13
  • Iko Turkey : 2019–20

Nigeria

  • Iko Mba Afrịka : 2013

Nigeria Olympic

  • Nzere maka ọla kọpa nke Olympics : 2016

Nke ya onwe ya

  • FIFA World Ball Championship Silver Ball: 2005
  • CAF Most Promising Talent Afọ : 2005
  • Chelsea Young Player nke Afọ: 2007, 2008

Ebe nsidee

Tags:

John Obi Mikel Ọrụ klọbJohn Obi Mikel Ọrụ mba ofesiJohn Obi Mikel Ndụ onye yaJohn Obi Mikel Ndekọ ọnụ ọgụgụ ọrụJohn Obi Mikel NsọpụrụJohn Obi Mikel Ebe nsideeJohn Obi MikelFootbọl

🔥 Trending searches on Wiki Ìgbò:

Onuora NzekwuFederal Capital Territory (Nigeria)Afia Amankwaah TamakloeNdi álákübaNgoni languageEstoniyaQueenNdi Yoruba1909NdiaCommon sunflowerGNU Free Documentation LicenseEnvironmental factorUweHip hop musicBauchiAdebayo FaletiUniversity of Benin (Nigeria)MYekaterina GamovaAles BialiatskiAkhabue Ebalu EvansChinụa AchebeHelena Kennedy, Baroness Kennedy of The ShawsOba of LagosAnụ rat nwere ọdụ ojii mosaic-tailedWiki FoundationBadagry FestivalNina Leopold BradleyRemaJoyce BandaGmailRYemi AladeMahadum Nke MaiduguriAdamu Garba TalbaAsusu SidamaFati Lami AbubakarAhmed BadoujMary NzimiroDavid OyedepoKadunaWayback MachineWizkidNaira MarleyChekiaUlo ukaHuman trafficking in NevadaMoshood AbiolaJamel DebbouzeReligion in NigeriaOverexploitationAsusu igboAgbor Gilbert EbotPornhubIgboKamal el-ShennawiGodBolanle NinalowoChinonso UkahZArise O Compatriots, Nigeria's Call ObeyJackie OrmesMark Angel (comedian)Mr MacaroniỌ̀mụ̀ntụdịỌdụm na-acha anụnụ anụnụ🡆 More