Burna Boy: Onye na-abụ abụ na onye na-ede abụ Naijiria (amụrụ 1991)

Damini Ebunoluwa Ogulu (amuru na abali abuo nke Julai 1991), onye ama ama Burna Boy, bu onye oti egwu na onye na ede egwu nke ndi Naijiria.

O bilitere bụrụ onye a ma ama na 2012 mgbe o wepụtara "Like To Party", egwu izizi si na L.I.F.E (2013). N'afọ 2017, Burna Boy bịnyere aka na nkwekọrịta Bad Habit / Atlantic Records, nakwa Warner Music Group mba ụwa. Ewepụtara album ya nke atọ Outside na 2018.A tọhapụrụ album nke anọ ya African Giant na July 2019. Burna Boy, onye nke tipụtere egwu wụrụ ewụ dika "Ye", "On The Low", "Anybody", ritere nturugo BET International Act n'afọ 2019.

Burna Boy
Burna Boy: Ndụ ya, Ọrụ egwu ya, Ụdị egwu
MúrúDamini Ebunoluwa Ogulu
Julai 12, 1991
Ụgwu Ọcha, Naijiria
OrüOnye na agụ egwu
Burna Boy
Burna Boy: Ndụ ya, Ọrụ egwu ya, Ụdị egwu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha ọmụmụDamini Ebunoluwa Ogulu Dezie
Aha enyereDamini Dezie
aha ezinụlọ yaOgulu Dezie
aha pseudonymBurna Boy Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya2 Julaị 1991 Dezie
Ebe ọmụmụUgwu Ọcha Dezie
ŃnàSamuel Ogulu Dezie
ŃnéBose Ogulu Dezie
nwanneAbụo Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, pidgin Naịjirịa, Asụsụ Yoruba Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, odee egwu, onye egwu, onye na-emeputa ihe ndeko Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Sussex, Oxford Brookes University Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)2010 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
ngwa egwuolu egwụ Dezie
diskografiBurna Boy discography Dezie
Ọrụ ama amaAfrican Giant Dezie
ụdịAfrobeat, dancehall, reggae, egwu hip hop, rhythm and blues Dezie
akara ndekọAtlantic Records, Warner Music Group Dezie
webụsaịtịhttps://www.onaspaceship.com/ Dezie
AgbụrụAsụsụ Yoruba Dezie
nnọchiaha nkeonweL485 Dezie

Ndụ ya

A mụrụ Damini Ogulu na Port Harcourt, Naịjirịa. Nna ya na-ahụ maka ụlọ ọrụ ịgbado ọkụ ma nne ya na-arụ ọrụ dịka onye ntụgharị. Nna nna ya Benson Idonije bụbu onye njikwa Fela Kuti. Ogulu toro na (5)Naijiria ebe ọ malitere iwepụta egwu nke ya site na enyemaka nke Fruity Loops.Ọ gụchara ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị nso na Lagos wee gawa London maka agụmakwụkwọ ọzọ.

Ọrụ egwu ya

2012–2015: L.I.F.E na On a Spaceship

Aristokrat Records weputara efere egwu izizi Burna Boy bụ L.I.F.E na ọnwa Ọgọọst 12, 2013. Ọ na-edochi mixtape nke abụọ ya bụ Burn Identity nke pụtara n'afọ 2011. L.I.F.E rere nkeji puku iri ano n'ụbọchị izizi ya. Aristokrat Records mechara resi Uba Pacific ikike efere egwu ahụ na ọnụ ihe dịka nde naira iri. E ji egwu dika "Like to Party", "Tonight", "Always Love You", "Run My Race" na "Yawa Dey" were kwado ọba egwu ahụ. Nke Leriq mepụta, enwekwara ndị otiegwu ọzọ pụtara na L.I.F.E dịka 2face Idibia, M.I, Timaya, Olamide, Reminisce na Wizkid. Ọ ghọrọ nọmba 10 na ndepụta Nigerian Entertainment Today nke ọbaegwu iri na abụọ kachasị mma na 2013. L.I.F.E nwere ụdị ụtọ dị ka egwu Fela Kuti, King Sunny Ade na Bob Marley. Anabatakwara ya nke ọma ma too ya maka ụda ya. E depụtara ya maka ọbaegwu kachasị mma n'afọ na mmemme 2014 Nigerian Entertainment Awards. N’ọnwa Ọgọstụ 2013, L.I.F.E ruru nọmba 7 na eserese Billboard Reggae Albums.

N’afọ 2014, Burna Boy gbara arụkwaghịm na Aristokrat Records. Ka afọ abụọ gasịrị, n’afọ 2015, o kpughee ụlọ ọrụ egwu ya akpọ Spaceship Entertainment.

Ọ wepụtara ọbaegwu nke abụọ ya On a Spaceship na 25 Nọvemba 2015. Na Septemba 2016, ọ wepụtara EP nwere egwu asaa akporo Redemption. Isi egwu ọbaegwu ahụ bụ "Pree Me" banyere na Noisey.

2018–ugbu a: Outside na African Giant

Na Jenụwarị 2018, e gosipụtara Burna Boy na "Sunshine Riptide", egwu si na MANIA, ọbaegwu asaa nke Fall Out Boy wepụtara na 2018. Ọ weputara ọbaegwu nke atọ ya Outside na Jenụwarị 26, 2018.

Na 21 Maachị 2019, Burna Boy weputara EP nwere egwu anọ anakpọ Steel & Copper, nke ọ mere, ya na ndi otu egwu elektrọnik si Los Angeles DJDS.

N'ọnwa Juunu 24, 2019, Burna Boy ritere nturuugo onye otiegwu mba ụwa kachasị mma na nturu ugo BET.

Ọ mere "Ja Ara E" nke pụta na ọba egwu Beyonce bụ The Lion King: The Gift. Ọ bụ ya bụ naanị otu onye otiegwu nwere egwu ya n'efere egwu ahụ.

A tọhapụrụ ọba egwu nke anọ ya African Giant na July 2019. E ji egwu dika "Gbona", "On the Low", Killin Dem", "Dangote", "Anybody" na "Pull Up" wee kwado ya.

Ọ malitere irụ ọru n'ọba egwu ahụ n'afọ 2018. Ọ gwara akwụkwọ akụkọ Billboard na ọba egwu ahụ bụ nke kachasị dị ya mkpa. O buru ụzọ kpughee atụmatụ ịwepụta ọba egwu ahụ na Eprel 2019 ma wee nwee nnọkọ ige ntị na Los Angeles.

E kesara foto na vidiyo si na nnọkọ ige ntị ahụ na soshal midia. E buru ụzọ kọwa African Giant dị ka ọba egwu nwere egwu iri na isii. Iji kwalite ọba egwu ahụ, Burna Boy bidoro njem nlegharị egwu akpọrọ African Giant Returns, ngalaba nke abụọ nke njem African Giant. Burna Boy tiri "My Money, My Baby", nke ejiri mee ihe egwu na-akụ n'okirikiri na fim ahụ Queen & Slim.

Ụdị egwu

Burna Boy na-akpọ ụdị egwu ya, Afro-Fusion. Ụdị nke na-agwakọta afrobeat, dancehall riddims, reggae, rap na R&B. August Brown nke akwụkwọ akụkọ Los Angeles Times kwuru na ụda Burna Boy mara mma ma di ohụrụ mana mbọ niile ọ na-agba emeputa egwu na-ewu ewu anaghị adọpụ ya uche.

Katalọgụ egwu

Ndepụta nke ọba egwu ya

  • L.I.F.E (2013)
  • On a Spaceship (2015)
  • Outside (2018)
  • African Giant (2019)
  • Twice as Tall (2020)

Mkpokọta egwu ya

  • Burn Notice (2011)
  • Burn Identity (2011)
  • Redemption (2016)
  • Steel & Copper (with DJDS) (2019)

Egwu nkwado

Afọ Aha Ọba egwu Ọmeputa egwu
2011 "Shobeedo" (Freestyle) Àtụ:N/a
2012 "Like to Party" L.I.F.E Leriq
"Tonight"
2013 "Run My Race"
"Yawa Dey"
"Celebrate" rowspan="5" Àtụ:N/a GospelOnDeBeatz
"Won Da Mo" (featuring D'banj) DeeVee
2014 "Rockstar" Leriq
"Don Gorgon" Spellz
"Check and Balance"
2015 "Soke" On a Spaceship Orbeat
"The Realest" Simba Tagz
"Rizzla" J Fem
2016 "Pree Me" Redemption Leriq
"Mandem Anthem" rowspan="2" Àtụ:N/a Fresh
2017 "Hallelujah" Killbeatz
"Rock Your Body" Outside Juls
"Streets of Africa" Leriq
"Koni Baje" P2J
"Sekkle Down" Jae5
2018 "Heaven's Gate" (featuring Lily Allen) Fred Gibson
"Ye" Phantom
"On the Low" African Giant Kel P
"Gbona"
"Killin Dem" (featuring Zlatan)
2019 "Dangote"
"Anybody" P2J
"Pull Up" Kel P

Egwu ndi Ọ soro na ya

Afọ Otiegwu Aha Ọba egwu
2013 Wande Coal "Amorawa" rowspan="1"Àtụ:N/a
Ice Prince "Gimme Dat" (also featuring Yung L and Olamide) Fire of Zamani
2014 DJ Spinall "Gba Gbe E" rowspan="1"Àtụ:N/a
AKA "All Eyes On Me" (also featuring Da L.E.S and JR) Levels
Sarkodie "Special Someone" (also featuring AKA) Sarkology
2016 Skales "Temper" (Remix) rowspan="2"Àtụ:N/a
2017 Airboy "Ayepo" (Remix)
Skales "Gbefun One Time" The Never Say Never Guy
Jesse Jagz "Violation" Odysseus
2018 Four of Diamonds "Name On It" Àtụ:TBA
Fall Out Boy ”Sunshine Riptide” Mania
Lily Allen "Your Choice" No Shame
DJ Spinall "Serious" Iyanu
Larry Gaaga "Baba Nla" (also featuring 2Baba and D'banj) Àtụ:N/a
Major Lazer "All My Life" Africa Is the Future
Show Dem Camp "Legend" Palm Wine Music 2
Peruzzi "Champion Lover" Heartwork
2019 Sauti Sol "Afrikan Star" African Sauce
Dave "Location" Psychodrama
Mahalia Burkmar "Simmer" Love & Compromise
Beyoncé "Ja Ara E" The Lion King: The Gift
DJ Snake "No Option" Carte Blanche
Jorja Smith "Be Honest" Àtụ:TBA
IDK "December" Is He Real
Wretch 32 "All In" Upon Reflection
Stormzy, Ed Sheeran "Own It" Heavy Is the Head

Ọba akwụkwọ

Tags:

Burna Boy Ndụ yaBurna Boy Ọrụ egwu yaBurna Boy Ụdị egwuBurna Boy Katalọgụ egwuBurna Boy Ọba akwụkwọBurna Boy

🔥 Trending searches on Wiki Ìgbò:

JoeboyThe PunchAissa Mama KaneÓjiAyoAmerican footballAdekunle GoldAbujaMobolanle Ebunoluwa SotunsaNeymarTrussell Trust2019 Akwa Ibom Steeti ntuli aka gọvanọSBakhresa GroupJenụwarịLibyaIbrahim BabangidaLeyna BloomNdị NaijiriaOmos25 MeeSuper Bowl XXXIri Ji ọhụrụ ndi IgboEthiopia1Blessing DialaTanzaniaWilliam ShakespeareDavido Music WorldwideX-pịa PearlF21 NovembaWikisourceAddis AbabaNdi Yoruba2 ỌgọọstWWW - Olee Ụwa Dị EbubeOgeneBola TinubuGeographic coordinate systemCaliforniaÁbuEnụgwụAmamiheAnatomy of HopeSpainAhmad Salihijo AhmadAbdullahi Garba AminchiAsụsụ HausaIhe nkiri nke NaịjirịaKụụụmụatị MontjaneMercedes CabralAKAKPỌIgbo cuisineỌrịa na-adịghị akwụsị akwụsịJimmy WalesKatherine MaherAdunni AdeAlbaniaAbduljabbar Nasiru KabaraNiveaBaskin-RobbinsZlatan (musician)Iri na abụoLouise GuthrieNew York CityGonzalo Higuaín🡆 More