Agulu bụ nnukwu obodo na steeti Anambra, Naijiria .
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
---|---|
asụsụ njieme | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
mba/obodo | Naijiria |
dị na ngalaba nhazi mpaghara | Anambara Steeti |
dị na mpaghara oge | UTC+01:00 |
nhazi ọnọdụ |
Ọ dị n'okpuru ọchịchị Anaocha . Ọ bụ ebe ọdọ mmiri Agulu. Ndị Agụlu gụnyere Gọvanọ Anambra Steeti gara aga Peter Obi, Senator Joy Emodi, Dora Akunyili bu onyeisi NAFDAC na mgbe gara-aga, Ifeanyi Eric okoye CEO Juhel pharmaceuticals, onye na-eme egwu, HE Amb. Justin Okechukwu Kingland (DRM), Founder Face Of Agulu, Anambra State. A makwa Agulu maka ebe mbuze nke Agulu-Nanka.
Obodo a nwere ụlọ ọrụ nzipu ozi, ụlọ ụka dị iche iche nke gụnyere ụka Anglican St Peters, ụka Katoliki Madonna Assumpta, nakwa ọtụtụ ụka Anglican na Roman Katọlik, ụka Pentikọstal wdg. Obodo a nwekwara ngalaba mmụta sayensị ọgwụ nke ụlọ akwụkwọ mahadum Nnamdi Azikwe, nakwa ụlọ ọrụ mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ nke National Agency for Food, Drug Administration and Control (NAFDAC).
Obodo Agulu nwere obodo nta ndị ọzọ nke ọnụ ọgụgụ ya di iri abụọ. Nke a gụnyere: Nwanchi, Nneohia, Okpu, Ama-Ezike, Odidama, Amorji, Isiamaigbo, Ukunu, Uhueme, Obeagu, Obe, Nkitaku, Okpu-Ifite, Umubialla, Amatutu, Umuowelle, Umunnowu, Ifiteani, Umugidiifite, na Nneo .
This article uses material from the Wikipedia Ìgbò article Agulu, which is released under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 3.0 license ("CC BY-SA 3.0"); additional terms may apply (view authors). Ọdịnaya dị n'okpuru CC BY-SA 4.0 belụsọ na edere ya otú ọzọ. Images, videos and audio are available under their respective licenses.
®Wikipedia is a registered trademark of the Wiki Foundation, Inc. Wiki Ìgbò (DUHOCTRUNGQUOC.VN) is an independent company and has no affiliation with Wiki Foundation.