Yahaya Abdulkarim

A họpụtara Malam Yahaya Abdulkarim dịka gọvanọ nke Sokoto Steeti, Nigeria site n'ọnwa Jenụwarị afọ 1992 ruo ọnwa Nọvemba afọ 1993, n'oge General Ibrahim Babangida gbalịrị ịgbanwe ọchịchị onye kwuo uche ya.

Yahaya Abdulkarim
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Ọgọọst 1944 Dezie
Ebe ọmụmụTalata Mafara Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiGovernor of Sokoto State, Minister of Works and Housing Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie

Mgbe ọ laghachiri n'ọchịchị onye kwuo uche ya na-afọ 1999, ọ mechara bụrụ ike na ngalaba otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke People's Democratic Party (PDP) na Zamfara Steeti, ma jee ozi nwa oge na kabinet nke onye isi ala Olusegun Obasanjo .

Yahaya Abdulkarim
Governor of Sokoto State
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In office
Àtụ:En dash range
Preceded byBashir Salihi Magashi
Succeeded byYakubu Mu'azu
Personal details
Born (1944-08-21) 21 Ọgọstụ 1944 (age 79)
Talata Mafara, Zamfara State, Nigeria
NationalityNigerian
Political partyPeople's Democratic Party

Ọrụ mmalite

A mụrụ Yahaya Abdulkarim na n'ụbọchị iri abụọ n'otu nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1944 na Talata Mafara, Zamfara Steeti. Nna ya bụ onye isi ikike ndị isi obodo. Ọ sonyeere ndị ọrụ bekee nke Steeti Ugwu ndịda anyanwụ dị ka onye nkuzi, ma nwee ọkwá dị iche iche tupu ọ laa ezumike nká n'afọ 1989 dị ka Onye nduzi izugbe na Onye ozi nke mmefu ego na Atụmatụ akụ na ụba na Sokoto Steeti .

Gọvanọ nke Sokoto Steeti

A họpụtara Abdulkarim dịka gọvanọ nke Sokoto Steeti, Naijiria n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 1992, na-anọchite anya National Republican Convention (NRC). Ọ bụ onye ọchịchị General Sani Abacha chụpụrụ ya n'ọchịchị n'ọnwa Nọvemba afọ 1993. N’oge ya n'ụlọ ọrụ ahụ, ya na Attahiru Bafarawa, onye isi oche otu NRC na steeti ahụ nwere esemokwu. Esemokwu ahụ dịgidere, mgbe Bafarawa mechara bụrụ Gọvanọ nke Sokoto Steeti n'afọ 1999, ọ gbasoro iwu nke ileghara okporo ụzọ na ụlọ niile nke gọọmentị Abdulkarim wuru. N'afọ 1992, Abdulkarim bịanyere aka na iwu nke guzobere Politeknik nke Talata Mafara , E mechara kpọọ Abdu Gusau Polytechnic .

Ọrụ Emechaa

N’ọnwa Septemba afọ 2002, ahọpụtara Abdulkarim na kọmịlị okpuru nke Ụlọ ọrụ mmepe Niger Delta ka ha leba anya n’ihe gbasara ijeri naịra ruru ijeri naịjirịa nke amalitere na steeti iteghete ndị na-emepụta mmanụ.

A họpụtara Abdulkarim dị ka Onye ozi na-ahụ maka Ọrụ na kabịnetị onye isi ala Olusegun Obasanjo n'ọnwa Julai nke afọ 2005. Ọ nọchiri Alhaji Saleh Shehu n'ọkwa a. N'ọnwa Nọvemba afọ 2006, ọ kpughere atụmatụ maka usoro mgbake okporo ụzọ sara mbara ma gbasie ike lekwasịrị anya n'oge ekeresimesi. Mgbe achụrụ onye ozi na-ahụ maka ọrụ Adeseye Ogunlewe n'ọrụ n'ọnwa Machị nke afọ 2006, E buliri ya n'ọkwa nke onye ozi na-ahụ mak ọrụ.  Mgbe e mesịrị iọbịara n'okpuru ịjụ ase nke Sịnetị maka omume ya mgbe ọ nọ n'ụlọ ọrụ.

Ọ bụ onye na-enweghị ihe ịga nke ọma maka ntuli aka gọvanọ nke Zamfara State n'okpuru otu ndọrọ ndọrọ ọchịchi Peoples Democratic (PDP) na nhoputa ndi ochichi nke ọnwa Eprel afọ 2007. Ka ọ na-eru afọ 2007, PDP Zamfara Steeti kewara n'otu abụọ, otu nke Abdulkarim n'edu ya na nke ọzọ nke onye ndụmọdụ ihe gbasara nchekwa obodo nke gara aga bụ General Aliyu Gusau n'edu. N’ọnwa Maachị afọ 2008, Abdulkarim duuru ndị nnọchi anya Zamfara ka ha rịọ onye isi ala nke PDP Vincent Ogbulafor, ka Gusau ghara itinye aka na ihe gbasara otu ndọrọ ndọrọ ọchịchi ahụ.

N'ọnwa Ọktọba afọ 2008, a kọrọ na a na-atụle ya maka ọkwa onye ozi na kansụl nke onye isi ala Umaru Yar'Adua .

Ebensidee

 

Tags:

Yahaya Abdulkarim Ọrụ mmaliteYahaya Abdulkarim Gọvanọ nke Sokoto SteetiYahaya Abdulkarim Ọrụ EmechaaYahaya Abdulkarim EbensideeYahaya AbdulkarimIbrahim BabangidaOlusegun ObasanjoPeoples Democratic PartyȮra SokotoȮra Zamfara

🔥 Trending searches on Wiki Ìgbò:

NamibiaKanayo O. KanayoCaliforniaCharles InojieAngolaPDPPublic domain1976Önwa mbu 8XVideosWiki20 Novemba22 Septemba1859Rukayya DawayyaAhmed Salah AbdelfatahRita EdochieStonebwoyTanzaniaMadagascarKatsinaManila CathedralUli (design)BÁbuJisọs KraịstNmanu nriMimisen IyorheÒrìmìlì IndiaZoroastrianismJumiaAsisat OshoalaȮra AbiaZuwaira GamboOhanaeze NdigboBongo–Bagirmi languagesỌ̀mụ̀ntụdị18 NovembaJudaismStella MbachuWikipidiaFunlola Aofiyebi-RaimiRouge (rapper)2001Mustapha LaribiOmosNdepụta nkàÁkọ na UcheMarchCyperus constanzaeLindsay Lohan's Indian JourneyRukky SandaKadunaFree contentÖnwa mbu 22Andres MarreroYemi Alade8 JulaịBilikisu LabaranMacedoniaUweJim IykeCaroline Danjuma🡆 More