Alice Iyabo Ojo (onye amuru na abali iri-abuo na otu n’onwa iri-abuo n’afọ 1977) bụ onye na-eme ihe nkiri naNigerian film actress, onye nchikọ, na onye meputa.
Ụlọ ọrụ mmepụta ihe | ụlọ ọrụ ihe nkiri, Ihe nkiri nke Naịjirịa, ụlọ ọrụ ntụrụndụ |
---|---|
ụdịekere | nwanyị |
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Alice Iyabo Ojo |
Aha ọmụmụ | Alice Iyabo Ogunro |
Aha enyere | Iyabo |
aha ezinụlọ ya | Ojo |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 21 Disemba 1977 |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Ńnà | Adekunle Ogunro |
Ńné | Olubunmi Fetuga |
nwanne | Babalola Ojo |
Dị/nwunye | Paulo |
nwa | Priscilla Ojo |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa |
Ọrụ ọ na-arụ | omee, onye na-emeputa ihe nkiiri, onye nhazi ndu ihe nkiri |
ụdị ọrụ ya | theater arts |
ebe agụmakwụkwọ | Lagos State University of Science and Technology |
ogo mmụta | Bachelor in Business Administration |
isi agụmakwụkwọ | Estate management |
Ebe obibi | Lekki |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1998 |
agbụrụ | Asụsụ Yoruba |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ụcha ime anya | brown |
ụcha ntụtụ isi | Ntụtụ ojii |
ihe nkiri | The Real Housewives of Lagos, Divorce Not Allowed, Under the Carpet |
Ihe nrite | Best of Nollywood Awards |
ahọpụtara maka | Best of Nollywood Awards |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
O gosiputara n’ime ihe nkiri otu bari na iri ise, ma mepụta ihe karịrị iri na ano nke ya.
Iyabo Ojo |
---|
A mụrụ Iyabo Ojo dị ka Alice Iyabo Ogunro na ụbochi iri abuo na otu na onwa iri na abuo afor 1977 na Lagos, Nigeria, ọ bụ ezie na nna ya si Abeokuta, Ogun State . Ọ bụ ọdụdụ nwa n’ime ụmụ atọ, nwere ụmụnne nwoke abụọ ndị tọrọ ya. Ọ gara ụlọ akwụkwọ na Lagos na National College, Gbagbada, tupu ọ gawa ọmụmụ Estate Management na Lagos State Polytechnic .
N'ịbụ onye sonyeere otu egwuregwu na ụlọ akwụkwọ sekọndrị, Iyabo Ojo bidoro ọrụ ya na 1998. O debanyere aha ya na Actors Guild of Nigeria omekome (AGN) site na enyemaka nke Bimbo Akintola, ọ nwekwara ike ịkparịta ụka na ndị ọzọ
Ojo edewo ma gosipụta na ọtụtụ ihe nkiri Naijiria. Ọrụ mbụ ya bụ na 1998 nke Satanic, ihe nkiri Bekee. N’afọ 2002, ya na Baba Darijinwon malitere Yoruba-language ya. Na Jenụwarị 2015, ihe nkiri ya bụ Silence, nke gosipụtara Joseph Benjamin Alex Usifo, Fathia Balogun, na Doris Simeon,, bụ nke pụtara na Silverbird Cinema Ikeja, na Lagos.
N’afọ 2004, Ojo bidoro imepụta ihe nkiri nke ya. Nmeputa mbu ya bu Bolutife, nke mezuru Bofeboko, Ololufe, Esan na Okunkun Biribiri . Ọ lụkwara di ya alụkwaghịm tupu oke aha ya amalite.
Lụrụ onye na-ere ihe nkiri na Lagos na 1999, mgbe ọ dị afọ iri abụọ na otu, ọ kwụsịtụrụ ịchụso ọrụ ya. Ọ mụrụ nwa nwoke wee mụta nwa nwanyị (nke amụrụ na 1999 na 2001 n'otu n'otu), ya bụ Felix Ojo na Priscilla Ajoke Ojo, mana ha agbaala nna ha alukwaghim. O kwuola na mbibi nke alụm di na nwunye ha bụ mgbe ha di obere. O kwuola banyere uche ya ịkwụsị isa aha di ya mbụ, Ojo.
Na ụbochi iri ato na otu na onwa asato na afo 2020, ọ na-eme emume ncheta ọmụmụ nne ya site na ịse foto mara mma nke o gosipụtara a igwe internet.
Iyabo Ojo weputara otu NGO ya akporo Pinkies Foundation, nke na ahu umuaka nwere mkpa puru iche na ndi enweghi ikike, na onwa Ise na afor 2011. Ọ emere emume ncheta afọ ise nke ntọala ahụ na Otu ụbochi na onwa ise na afor 2016 na R&A City Hotel, Ikeja, Lagos.
This article uses material from the Wikipedia Ìgbò article Iyabo Ojo, which is released under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 3.0 license ("CC BY-SA 3.0"); additional terms may apply (view authors). Ọdịnaya dị n'okpuru CC BY-SA 4.0 belụsọ na edere ya otú ọzọ. Images, videos and audio are available under their respective licenses.
®Wikipedia is a registered trademark of the Wiki Foundation, Inc. Wiki Ìgbò (DUHOCTRUNGQUOC.VN) is an independent company and has no affiliation with Wiki Foundation.