Ngwa Egwu Ọjà: Ngwa egwu ọdịnala ndị Igbo

Ọjà bụ ngwa egwu si n'ọwụwa anyanwụ Naijiria nke a na-ejikarị ngwa ndị Naijiria ndị ọzọ dị ka ekwe, udu, igba, okwa na ichaka/osha eji agu egwu.

Ọja
Ngwa Egwu Ọjà: Nkọwa, Ụdị ọjà, Ngwa egwu Igbo ndị ọzọ
ngwa egwu
mba/obodoNaijiria Dezie
ebeNdịda ọwụwa anyanwụ Naijiria Dezie
ndị ji ya eme iheNdị Igbo Dezie
ihe eji ya emeomenala, egwu nka Dezie

Ngwá egwú a pụrụ iche ‘na-ekwu okwu’ ka ndị na-akụ egwu na ndị na-agba egwú, na-agba egwu. N'oge a na-agba egwu mmawu na ọwụwa anyanwụ Naijiria, onye ọfụfụ oja na-edu egwu na abụ otuto. Onye isi ofufu ọjà na-enwe ike iwepụta ọtụtụ ụda dị ka okwu ọnụ. Ọ bụrụ na onye dị mkpa abanye n'ime oghere igba egwu, onye n'afu ọjà nwere ike iji ngwá egwu a kpọsaa aha onye ahụ.

Nkọwa

Ngwa Egwu Ọjà: Nkọwa, Ụdị ọjà, Ngwa egwu Igbo ndị ọzọ 
ngwa egwu Afrika

Ọjà bụ ngwa egwu agụnyere na ngwa egwu ikuku. E nwere ihe abụọ a na-eji arụ ya, nke mbụ bụ osisi, nke na-abụkarị osisi dị nro ma na-egbuke egbuke; nke abụọ bu nke e ji achara mee. N'ime ụdị ihe abụọ a e ji arụ ya, nke osisi na-aka nọtee aka ruo ogologo oge. Ọjà dị ezigbo mkpa, nwekwa ike na ọrụ dị omimi ọ na-arụ na omenala nakwa ndụ ndị Igbo. Ihe e ji mara ọjà bụ ụdị ụda dị elu dị iche iche ọ na-emepụta, na-agbanyeghị na ọ bụ ngwá egwu dị ntakịrị. Ọjà kachasị ukwuu onye odeakwụkwọ bụ Paul Basu chọpụtara dị ihe dịka 26cm n'ogologo, ma nke kacha nta dị 14cm n'ogologo. Ogo ọjà ọbụla na-ekpebi ịdị elu nke ụda ya nakwa ịdị mma ya na ọrụ dịka ngwá egwu.

Ụdị ọjà

Ndepụta ndị a dị n'okpụrụ n'akọwa ụdị ọjà di iche iche na ala Igbo

  • Ọjà Mmanwụ: ọjà eji eme mmemme mmanwụ
  • Ọjà Okolọbia: ọjà nke a bụ nke a na-eji eme emume ụmụ nwoke topụtara dimkpa
  • Ọjà Igede: Nke a bụ ọjà uda ya kacha dị ala. Igede bụ ịgba a na-eji eme emume olili mmadu. A na-eji Ọjà igede eme ihe n'ụzọ abụọ, nke mbụ bụ ọjà nwoke, nke na-akpọ oku; nke abụọ bụ ọjà nwanyị; nke na-aza aza.
  • Ọjà Ukwe: a na-eji nke a eme mmemme maka ịgba ụdị egwu ụmụ nwanyị ọ bụla.

Ngwa egwu Igbo ndị ọzọ

Reference

Tags:

Ngwa Egwu Ọjà NkọwaNgwa Egwu Ọjà Ụdị ọjàNgwa Egwu Ọjà Ngwa egwu Igbo ndị ọzọNgwa Egwu Ọjà ReferenceNgwa Egwu ỌjàEkweIgbaMmanwụNaijiriaUdu

🔥 Trending searches on Wiki Ìgbò:

ISBNMarley MarlMarsilio FicinoDwarfismSuper Bowl XXXInternational Union of Air Pollution Prevention and Environmental Protection AssociationsBimbo ManuelMohBadWorld War IINaija NewsNollywoodMaryam YahayaZimbabweOlamideFaithia WilliamsJoyNneEshetu TuraMuhammadu BuhariVanguard (Nigeria)Davido Music WorldwideChloé ZhaoQuinta KinyuyOge ehihieTewodros Shiferaw12 NovembaSomaliland27 DisembaJorjiạ (state)Ndi HaụsaThe Wound (ihe nkiri 2017)23 SeptembaDavidoLove Faces (ihe nkiri)IgboAbiribaPhone SwapIP address20075 NovembaXXYYXXLesothoChinaObodo AustinArgentinaNaijiriaAdunni AdeChuma MmekaMadagascarAdaGoatỤloelu maka NwaNewsPrince Asem bin NayefEbe a na-anọ na BezabehEmeka IhediohaȮra ỌyọNọmba njirimara a na-agbanwe agbanwe21 NovembaAzubuike IhejirikaOmotola Jalade EkeindeEnuani dialectDJ CuppySwitzerlandWiktionaryOmenalaYearr7o1wAPIGombe🡆 More