Stephanie Linus (Amụrụ ya Stephanie Onyekachi Okereke; na-abali abụọ n'ọnwa iri na-afọ 1982) ọ bụ otu onye egwuregwu onyo-onyoo nke ala Naijiria (Nigerian actress), film director na model.
Onwetala ọtụtụ inwe na nghọpụta di iche-iche maka ọrụ ya dika omee ihe onyo-onyoo, nke tinyere: '2003 Reel Award for Best Actress', '2006 Afro Hollywood Award for Best Actress', na nghọpụta atọ ọzọ tinyere Best Actress in a Leading Role na Africa Movie Academy Awards' na-afọ 2005, 2009 na 2010.ọ bụkwa onye na-esote 'Most Beautiful Girl in Nigeria' na nzukọ ụmụ nwanyi makachara na mma na-afo 2002. Na-afo 2011, Ndi ọchichi ala Naijiria họpụtara ya dika ọ tụ onye (Member of the Order of the Federal Republic, MFR).
Amụrụ Stephanie Okereke na Ngor Okpala, Imo State. ọ bụ nwa nke isii nke Mazi na Odoziakụ Chima na Mary Okereke. ọ guchara ụlọ akwụkwọ praịmarị na ụlọ akwụkwọ praịmarị na Delta State. ọ gara Mahadum na University of Calabar, nke di na Cross River State, ebe ọguru 'English and Literary Studies'.
Obidoro mewa ihe onyo-onyoo mgbe ọ na-etolite. Na-afọ1997 mere ihe onyo-onyoo Nollywood abụọ nke akpọrọ 'Compromise 2' na 'Waterloo'. N'oge 'Most beautiful girl in Nigeria' na-afọ 2002, Okereke gbara onye abụọ Mgbe e mesịrị na-afọ 2003, Okereke nwetara inwe abụọ n'ime nghọpụta asatọ onwetara na 2003 'Reel Awards for 'Best Actress - English' na 'Best Actress of the year 2003'. Mgbe ọgụchara akwụkwọ na 'New York Film Academy' na-afọ 2007, Okereke tọhapụrụ ihe onyo-onyoo nke akpọro 'Through the Glass' nke ọrụ ya bụ onye ntụziaka (director), Ode akwụkwọ ihe onyo-onyoo (scriptwriter), onye mmepụta (producer) na onye omee nke ihe onyo-onyoo (actress). Ihe onyo-onyoo a nwetara nghọpụta na 'Africa Movie Academy Award' maka 'Best Screenplay' na-afọ 2009. Na-afo 2014, O mepụtara ihe onyo-onyoo ọzọ nke aha ya bụ 'Dry' ebe ọrụkwara orụ onye ntụziaka (director), Ode akwụkwọ ihe onyo-onyoo (scriptwriter), onye mmepụta (producer) na onye omee nke ihe onyo-onyoo (actress) nke nwetakwara ọtụtụ inwe nke tinyere '12th Africa Movie Academy Awards na 2016 Africa Magic Viewers Choice Awards' nakwa onyinye ụgbọala ọhụrụ. Okereke emela ihe onyo-onyoo iri na itoolu (90).
N'ọnwa anọ na-afọ 2005, Okereke nwere mgberede okporoụzọ nke mereka ọgbajie aka makwa nwee ọkụ orire ebe ọ na-aga 'African Movie Academy Awards' na Yenagoa, Bayelsa State, Nigeria.
N'ọnwa anọ na-afọ 2012 Okereke lụrụ di ya Mazi Linus Idahosa na Paris, France, mee mmemme na-abughi nke ọha nke tinyere ndi ezinulọ ya na ọtụtụ ndi Nollywood. N'ọnwa iri na-afọ 2015, ọmụrụ nwa nke mbụ ha bụkwa diọkpara ha Maxwell Enosata Linus.
Afo | Mmemme | Onyinye | Recipient | Result |
---|---|---|---|---|
2002 | Most Beautiful Girl in Nigeria | Herself | Runner-up | |
2003: | What a Year Awards | Best Actress | Herself | Merie |
2003 | Reel Awards | Best Actress - English | Herself | Merie |
Best Actress of the year | Herself | Merie | ||
2004: | Afro-Dublin Awards | Outstanding Actress | Herself | Merie |
2004 | Film Makers of Nigeria | Award For Excellence | herself | Merie |
2005: | 1st Africa Movie Academy Awards, | Best Actress in a Leading Role | Herself | Ahọpụtara |
2006 | Afro Hollywood Award | Best Actress | herself | Merie |
2009 | 5th Africa Movie Academy Awards | Best Actress in a Leading Role | Reloaded | Ahọpụtara |
Best Screenplay | Through the Glass | Ahọpụtara | ||
2010 | 6th Africa Movie Academy Awards | Best Actress in a Leading Role | Nnenda | Ahọpụtara |
2013 | Montage Africa Women of Exllence Awards | Achievement In drama and entertainment | Herself | Merie |
2015 | 2015 Best of Nollywood Awards | Movie With the Best Social Media | Dry | Merie |
Best Actress Leading Role | Ahọpụtara | |||
Best Director | Ahọpụtara | |||
Movie Of The Year | Ahọpụtara | |||
Bentonville Film Festival | Best Protagonist | Merie | ||
ZAFAA Global Awards | Best Actress | Merie | ||
Best Film | Merie | |||
Best Producer | Merie | |||
Best Director | Merie | |||
2016 | 12th Africa Movie Academy Awards | Best Nigerian Film | Merie | |
Best Film | Ahọpụtara | |||
Best Director | Ahọpụtara | |||
2016 Africa Magic Viewers Choice Awards | Best Overall Movie (Africa) | Merie | ||
Best Director | Ahọpụtara | |||
Best Movie West Africa | Ahọpụtara | |||
Pan African Film Festival | Programmers'Award Narrative Feature | Merie | ||
Nafca | Best Actress In Leading Role | Merie | ||
Best Overall Movie | Merie | |||
Best Director | Ahọpụtara | |||
Best Screenplay | Ahọpụtara | |||
Best Drama Film | Ahọpụtara | |||
DALA awards | Face of Nollywood (Female) | Herself | Merie | |
2017 | Truth Awards | Best Supporting Actress | Boonville Redemption | Merie |
Afọ | Film | ọru ya | Ndetu |
---|---|---|---|
1997 | Compromise 2 | ||
Waterloo | |||
2002 | Pretender | ya na Patience Ozokwor na Tony Umez | |
Blind Justice | ya na Tony Umez | ||
2003 | Aristos | ||
Emotional Crack | ya na Ramsey Nouah, Dakore Egbuson nakwa Patience Ozokwor | ||
Genesis of Love | |||
Private Sin | ya na Genevieve Nnaji, Richard Mofe-Damijo na Patience Ozokwor | ||
Queen Sheba | |||
The Cross of Love | ya na Patience Ozokwor | ||
Together as One | |||
2004 | Beautiful Faces | ya na Ini Edo | |
Critical Decision | ya na Genevieve Nnaji, Richard Mofe-Damijo & Mike Ezuruonye | ||
Deep Loss | ya na Desmond Elliot | ||
Diamond Lady: The Business Woman | |||
Dream Lover | Benita | ||
Eye of the Gods | ya na Ini Edo | ||
In the Name of Love | ya na Desmond Elliot | ||
Last Girl Standing | |||
Magic Moment | Stephine Okereke | ya na Desmond Elliot | |
Mama-G in America | ya na Patience Ozokwor | ||
Miss Nigeria | |||
More Than a Woman | |||
My Mother My Marriage | |||
Official Romance | ya na Zack Orji | ||
Promise & Fail | ya na Desmond Elliot | ||
Promise Me Forever | ya na Nnaji | ||
Right Man for Me | ya na Tony Umez | ||
Sensational Spy | |||
Strength of a Woman | |||
To Love Again | |||
Virgins Night Out | |||
Working Class Lady | ya na Rita Dominic | ||
2005 | A Time to Die | ||
Days of Bondage | Lucia | ||
Guys on the Line | ya na Rita Dominic | ||
Lonely Hearts | ya na Ini Edo | ||
Ola... the Morning Sun | ya na Pete Edochie | ||
Omalinze | Adaugo | ya Onyeka Onwenu | |
Price of Ignorance | ya na Pete Edochie | ||
Princess of Wealth | |||
Royal Battle | |||
Street Fame | |||
Windfall | |||
Woman on Top | |||
2006 | Behind the Plot | ya na Desmond Elliot | |
Daytime Lovers | Binta | ya naTony Umez | |
Efficacy | ya na Desmond Elliot | ||
Shut In | |||
Sitanda | onye ntuziaka ya bụ Izu Ojukwu, Ihe onyo-onyoo a nwetara nghoputa itoolu makwa nweta ihe inwe ise na 3rd African Movie Academy Awards na-afo 2007, tinyekwara Best Picture & Best Nigerian Film. | ||
The Law Students | |||
The Preacher | |||
Upside Down | ya na Patience Ozokwor na Tony Umez | ||
2007 | A Time to Love | Hope | ya na Desmond Elliot |
Governor's Wife | ya na Ramsey Nouah | ||
2008 | Mission to Nowhere | ||
Hidden Treasure | Nadine | ya na Ramsey Nouah, Nadia Buari & Olu Jacobs | |
Through the Glass | Ada | ya na Garrett McKechnie, Christy Williams, Pascal Atuma | |
2009 | Nnenda | onye ntuziaka ihe onyo-onyoo a bụ Izu Ojukwu, onwetara nghoputa ato na African Movie Academy Awards na-af 2010, tinyekwara nghoputa na Heart of Africa | |
Reloaded | Weyinmi | ya na Ramsey Nouah, Desmond Elliot, Rita Dominic & Nse Ikpe Etim | |
2014 | Dry | Dr Zara | ya Liz Benson |
2015 | Make Me Fabulous |
This article uses material from the Wikipedia Ìgbò article Stephanie Okereke Linus, which is released under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 3.0 license ("CC BY-SA 3.0"); additional terms may apply (view authors). Ọdịnaya dị n'okpuru CC BY-SA 4.0 belụsọ na edere ya otú ọzọ. Images, videos and audio are available under their respective licenses.
®Wikipedia is a registered trademark of the Wiki Foundation, Inc. Wiki Ìgbò (DUHOCTRUNGQUOC.VN) is an independent company and has no affiliation with Wiki Foundation.