Stéphane Gagba (Hebrew: amụrụ na onwa Mee abali iri Na ato afo 1998), nke a maara nke ọma dị ka Stéphane Legar ( «), bụ onye mba Togo nwere akwụkwọ obibi Isreal na-agụ egwu, na-agba egwu, na onye nlereanya.
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Togo, Israel |
aha n'asụsụ obodo | Stéphane Legar |
Aha ọmụmụ | Stéphane Gagba |
Aha enyere | Stéphane |
aha pseudonym | Stéphane Legar |
Ụbọchị ọmụmụ ya | 13 Mee 1998 |
Ebe ọmụmụ | Bat Yam |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | French language, Hebrew, Ewe, African French |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2016 |
agbụrụ | Togolese, African people, Ewe |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
ngwa egwu | olu egwụ |
ụdị | egwu hip hop |
akara ndekọ | Warner Music France, Unicell |
Aha ọgbọ ya bụ Legar ma ọ bụ Le Gar - na mkpirisi maka Le Garcon, "nwa nwoke" na asusu French. A na-akpọkarị ya aha ya bụ Stéphane.
A mụrụ Stéphane Gagba na Bat Yam, Israel, nne na nna ya bụ Ndị Kraịst si Togo. Nne na nna ya bụ ndị nnọchi anya mba ọzọ na-arụ ọrụ na ụlọ ọrụ nnọchiteanya Naịjirịa na Israel n'oge ahụ. O nwere nwanne nwanyị tọrọ ya. Mgbe ọ bụ nwata, ọ nọrọ ọtụtụ oge ezumike ya na-eleta ndị ikwu ha na Togo.
Mgbe ọ bụ nwata, a họpụtara ya maka ịchụpụ ya n'Izrel - n'ihi enweghị akwụkwọ nwa amaala - ebe ọ bụ naanị ọnọdụ obibi ka onwere Ọ bụ ezie na, ọ bụ nwa amaala Togo (paspọtụ Togo). Ruo mgbe ọ dị afọ iri, nne na nna ya chebere ya pụọ na mmata a. N'ikpeazụ, ọ nwetakwara nwa amaala Israel - mana ọ bụ naanị mgbe ọ gụsịrị ọrụ agha Israel, na abali ato nke onwa Mee 2021.
Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, Legar na ezinụlọ ya kwagara Holon, Israel. Ọ gara ụlọ akwụkwọ obodo ndị ntorobịa Mikveh Israel, na mpaghara French ya. O debara aha ya n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2017 na Ndị agha nchekwa mba Israel, ma jee ozi na ngalaba na-ahụ maka ịkọwa usoro ntinye akwụkwọ na ụmụ akwụkwọ sekọndrị.
Asụsụ ala ya bụ French, mana ọ na-asụkwa asụsụ Hibru, Ewe (Togolese), Bekee, na Spanish nke ọma.
Afọ | Ihe nrite | Category | Ọrụ a họpụtara | Nsonaazụ |
---|---|---|---|---|
2017 | MTV Europe Music Awards | Iwu kacha mma nke Israel | Ya onwe ya | Ahọpụtara |
2018 | Ahọpụtara |
This article uses material from the Wikipedia Ìgbò article Stéphane Legar, which is released under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 3.0 license ("CC BY-SA 3.0"); additional terms may apply (view authors). Ọdịnaya dị n'okpuru CC BY-SA 4.0 belụsọ na edere ya otú ọzọ. Images, videos and audio are available under their respective licenses.
®Wikipedia is a registered trademark of the Wiki Foundation, Inc. Wiki Ìgbò (DUHOCTRUNGQUOC.VN) is an independent company and has no affiliation with Wiki Foundation.