Ilu Igbo

Ilú bu mmánú ndi igbo ji eri okwu.ona-abu okenye kwube okwu otinyero ilu,oburu okwu nwata.

Dị ka e kwuru, ọ bụrụ na ị gbara ndị okenye ọsọ n'ihi ajọ ume, ị gaghị enweta amamihe. Ilu bu otu njirimara ndi igbo. Osokwazi n'otu ejije ndi igbo. Ya mere na onye igbo obula kwesiri ima otu esi eji ha na mkparita uka na ighota ihe niile di na ndu maka na agwọ emeghị ihe o ji bụrụ agwọ, ụmụaka ewere ya kee nkụ. Ilu ndi igbo na akpali amamihe si'te na ịmetụ akụkụ dị iche iche nke ndụ aka .

Ibi-kọ ọnụ na n'udo

  • Égbé belu ugo belu,nke si ibe ya ebena,nku kwaa ya
  • E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ.
  • Onye yi uwe agbazitere agbazi anaghị agba si egwu ike.
  • Ikwu amaghị ibe ezi ya.
  • Akidi si na ọ maghị ebe ókè ala ahụ dị.
  • Di na nwunye rijuo afọ malite ịlụ ọgụ, ndi bụ ọnụ aka ha mma.
  • Ọ nweghị onye Chukwu n'agọzighị, sọ onye ahụ si na nke ya ezughị okè.
  • Emenyere nwaogwugwu, emenye kwara nwọnọsike.
  • Ọ bụrụ na nwanyị na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, di ya anaghị ajụ iri nri ya.
  • ọkụkọ kwuru na ọ naghị eti mkpu ka ihe ahụ jide ya tọhapụ ya, kama ọ bụ ka ndị mmadụ na uwa níle nụ’ru olu ya.
  • Ebe amuru nmadu ka ana ama maka ya
  • Mgbe mbe zutara akwa ọfụrụ, ọ na-aga nzukọ iji dozie esemokwu, n'agbanyeghị na onweghị onye kpọrọ ya.
  • Nwata bulie nna ya enu, ákwà mkpuchi nna ya ga ekpuchi anya nwata ahụ.
  • Onye ji mmadu n’ala ji kwa onwe ya.
  • Mgbe onye nwe ụlọ malitere ịgosi onye ọbịa ji fọdụrụ n'ite, mara n'oge una erugo.
  • Kelee onye nti chiri, oburu n’eluigwe anughi, uwa nuru.
  • Onye maara ihe n’Aba bu onye nzuzu n’Abba.
  • Ewu nke onye ogbenye bụ ehi ya.
  • "Nwunye anyị, nwunye anyị", mgbe abalị ga-abịa, anyị ga-ama onye ọ bụ nwanyị ya n'ezie.
  • Ọgọ biakaria, ezie ya n'kpata nkụ.
  • Onye di nkirika jee akwamozu, a sị ya nyere ndi na-egbu anụ aka.
  • Nwata hụkarịa enyi nne ya, o gbuo ya mmaekwu.
  • Ndụ mmiri, ndụ azụ, mmiri atala, azụ anwụla.
  • Ụtọ bụ elecha aghara.
  • Mgbe otu onye isi di mma kpọrọ ndi ara itenanị gafee, ihe anyi mara bụ na ndi ara iri gafere.
  • Udele na égbè anaghị azọ nri; udele na-eri ozu; égbè na-ebu na n'ike.
  • Onye nwere mmadụ ka onye nwere ego.

Ilu banyere akụ na ụba na ịda ogbenye

  • Onye na achikota ji di ka aku n'uba kwesiri iweputa oge je leta ndi be’nne ya nihi na obughi ji ka oga agbakwuru oso ma o’rue mgbe nsogbu ga a’bia.
  • Ọ bụrụ na mmadụ achịkọta akụ na ụba n’erighị ihe, ọ hụbeghị ka o si dị onye nwụrụ anwụ?ọ bụrụ na okwu abaa na ego, onye dara ogbenye na agbachi nkịtị.
  • Aki oyibo si na onye bara ọgaranya na-eri nri obere obere.
  • Nwa ọkụkọ si na si'te na ịtụ nri obere ebe a na ebe ozo ka oji eri ju afọ.
  • Ewu nwuru n'oba ji abughi agu gburu ya.
  • Enweghi ego na'eme ede adi ụtọ dị ka ji.
  • Onye nwere ihe ọriri ọbụla na-ekwu na ede na agbakasi ya ahụ na akpasụ ya iwe.
  • Nwa ogbenye anaghi aza omeokachie.
  • Onye ọ dịrị mma kwaa nna, ọ bụghị diọkpara gburu ya.
  • Ọkụkọ na-akpa nri n'obi onye ohi nọ ite ofe nso.
  • Akụ bụ iro, nwata kpata akụ, ọ kpata iro.

Ilu banyere ọrụ

  • Adịghị ebute ozu ọdụm n'ụlọ.
  • Aka aja aja na ebute ọnụ mmanụ mmanụ.
  • Ahịa ukwu amaghị na otu onye abiaghị.
  • A rụọ na anwụ, erie na ndo.
  • Ụwa dịka ara nne ehi, ọ gaghị agba mmiri ma ọ bụrụ na ịpighị ya aka ọfuma.
  • Ube mere ihe ézè ji rachaa ntụ.
  • Onye kwe, Chi ya ekwe.
  • Agbaka m mbọ bụ ego nri, ụba si na Chi.
  • Nwata kpata kalịa ibe ya na nkụ, a sị n'ọkpalụ n'ajọ ọhịa.
  • Mgbe onye ji tete ụra bụ ụtụtụ ya.
  • Azụ rahụ ụra, azụ ibe ya elo ya.
  • Ahịa onye na-azụ ka ọ ma anya ya.
  • Diji kwụrụ ọtọ gwubie ji ọdụ, ọ ma nọdụ ala bọpụta ya.
  • Agaghị eji mgbagbu ghara ọgụ.
  • Ihe na esere mkpi na onye kpụ ya bụ; gasie ike.
  • Ihe agụ ji eme ire di ya na mbọ aka.
  • "Nkem abụghị nsogbu", ka uzú na-ekwu mgbe ọbụla, ya kpatara na ọ nweghị mma agha.
  • Ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa.
  • Ọ bụrụ na ihe nile diri egbe mma n'elu, ọ gaghị agbadata n'ala izu uriọm.
  • Ọ bụ naanị ụkwụ gbara apịtị na-eri ihe gụrụ ya.
  • Udele sịrị, na nwa nwunye ya mụrụ dị ndụ, ya enwee nwa; Ọ nwụọ anwụ ọ, ya enwe nri abalị.
  • Emesia, emesia bụ ọnwụ na-egbu onye ume'ngwụ.
  • Ọ na-abụ azọta ala tupu azọwa ute.
  • Aki ga-agba mmanụ aghaghị igabiga n'ọkụ.
  • Otu onyeara ka asị bịa kere oké ihe nna ya nwụrụ anwụ, ọ sị na nke o ji ka.
  • Nwa okuko uriọm hapụ nne ya kpawa nri, egbe eburu ya.
  • Ọkụkọ na-akwa ákwá nwere mgbe ọ bụ àkwá.
  • Ọ bụ naanị nwata na-eti aki ewegara okenye ka ọ na-azọtara nkume.
  • Mgbada sịrị onye chọrọ igbu ya buru ụzọ metee ya n'ụra, ma ya bụrụzia na ya ejighị ọsọ zọpụta onwe ya.
  • Mbe si na olụ ọha di mma, mana oriri ọha na-agwu ike.
  • E were otu ọkụkọ chụọrọ arụsi abụọ àjà, ha egbuo mmadụ mezuo ya.
  • Oké nkịta sịrị na ọ bụ anya ka ya ji eri àjà a chụrụ n'elu.
  • Mgbe nnukwu anụ ji apụta n'ọhịa bụ mgbe dinta sọrọ ngọngọ ọrụ.
  • Ụtụtụ bụ ahịa mana ehihie bụzi maka ekwurekwu.

Ọkwu amamihe maka ọnwụ

  • Ọnwụ na ihụ ọgụ na-esi na chi.
  • E gbuo maka iwe, e nie maka isi isi.
  • Ọ buru na ọnwụ egbughị nwata akwụkwọ, ọ ga-abụ onye nkụzi.
  • Ụwa bụ ahịa onye zụchaa, ọ naa.
  • Ozu kwe ka ọ hà, e'lie ya n'oge.
  • Ọ bụ mmụọ ndi na-efe na-egbu ha.
  • A tụọ onye iro ndụ, ọ zụta ọnwụ.
  • Onye gburu nwanne ya abụghị Odogwu.
  • Ekweghị ekwe na-ekwe n'ute ekwere.
  • Ọnwụ egbughị ji e jiri chụọ àjà, e mesie o pue ome.
  • Ọnwụ amaghị eze; ọ na egbu onye ukwu, ọ na egbu onye nta.
  • Osisi ahụ gburu mmadụ dị elu karịa onye ahụ.
  • Atụrụ sịrị na ọ na-aka mma a mụọ nwa ka a tụrụkwa ime ọzọ, n'ihi na ọnwụ di na-abịa na mberede.
  • Onye na-emegbu nwa mmadụ, ọ ga-edu nke ya were laa mmụọ.

Nkpachapu anya/ọkwu ndụmọdụ

  • Ihe ehi hụrụ gbalaba ọsọ ka ọkụkụ hụrụ na-atụ ọnụ.
  • Osimmiri anaghi eri onye ọ hụghị ukwu ya.
  • Ka enetachaa,ka enetachaa melu mgbó ji atu enwe n'isi.
  • Ọ bụghị egwu ọ bụla ka ana-agba chiri ụtaba na aka.
  • Awó anaghi agba oso ehihie na efu.
  • Nwata n'agba sụrụgede, marakwa na sụrụgede bu egwu ndi mmụọ.
  • A na-eji anya a'mara ọka cha ra acha.
  • Nwata akwo n'azu amaghi na ije di úfú.
  • Nwam anwula,nwam anwula..nwam ichoo inwu inwuo abo adighi n'ulo odi n'ohia.
  • Mgbe enyí tinyere ụkwụ ya n’ala, onye ọ bụla na-ahụ ụzọ ụkwụ ya.
  • Enwere ahihia di iche iche n’ime ohia, mana ndi mmadu na abanye ohia na acho akwukwo okazi.
  • Nwa ọkụkọ kwuru na ọ na - ele anya n’elu mgbe ọ na a nnu mmiri n’ihi na ihe na egbu ya sitere n’elu abia.
  • Ọ bụrụ na nwatakịrị na amabeghi ihe jụ wa ese ihe mere nna ya, ihe mere nna ya na-eme ya.
  • Ọkụkọ nti ike na-anụ ihe na ite ofe.
  • Ọ bụrụ na e nye isi ndụmọdụ ma ọ naghị anụ nti, mgbe ebichapuru isi, nti ga esoro ya banyere n’akpa.
  • Ụkpana okpoko gburu, ntị chiri ya.
  • Ugo rie awọ, mma ya arụọ.
  • Nwayọ ka eji egbu anwụnta bèlù na akpa amụ.
  • Nkwụ́cha abụghị ụjọ.

Okwu amamihe izugbe

  • Ihe ọ masịrị gi sa'cha otele, ọ gaghị ịnyụ ahụrụ.
  • Ugboro abụọ ka ekwe n'akpọ dike; ọ kpọ ya na ndụ, ọ kpọ ya n'ọnwụ.
  • Onye nụrụ olu ndị okenye, dịka onye jere n'áfà.
  • Anaghị ezi nwata ọnụ ara nne ya.
  • Ọ bụrụ na onye ntị chiri anụghị ụda ụgụrụ ka ọ na efe, ọ gaghị amakwu na oyi na-atụ?
  • Gidi gidi bu ugwu eze.
  • Onye Nze n’amaghị ihe ọ ga-ekwu, kwuru na ndị ibe ya ekwuola ihe di ya n'uche ọ gaara ekwu.
  • Otu mkpụrụ akwụ adịghị efu n’ime ọkụ.

Ilu ndia so na ndi di nkpa n'ala igbo.marakwa na dika Nwa afo igbo, iga agba mbo muta ilu nakwazi omenaala igbo.

Tags:

Ilu Igbo Ibi-kọ ọnụ na nudoIlu Igbo Ilu banyere akụ na ụba na ịda ogbenyeIlu Igbo Ilu banyere ọrụIlu Igbo Ọkwu amamihe maka ọnwụIlu Igbo Nkpachapu anyaọkwu ndụmọdụIlu Igbo Okwu amamihe izugbeIlu Igbo

🔥 Trending searches on Wiki Ìgbò:

Ulo Oru Trakto ndi AlgeriaIThe Red Moon (ihe nkiri)President of the United StatesFrank Edwards (gospel musician)SerbiaDerrick AdamsNkeji Ochíchííwu KanoSchool Strike for ClimateDigital motion X-rayDaniel Aladesanmi nke AbụọFishAssouma UwizeyeỤloelu maka NwaAnimalSamuel Amo TobbinGreeceAsụsụMoonchild SanellyDanièle ObonoỤlọ TechwoodJosIri abụo na otuDora AkunyiliDimeji BankoleAkMMGoldie HarveyAriyike OwologbaDan MarayaJamesHausaGuineaỤkwụ abalịOnikan StadiumỌrụ NkuziDalal Abdel AzizOmar YehiaNonso DiobiAli JitaNgozi EzeonuTyra BanksFree contentDaisuke IshiwatariNew York CitySabo Bakin ZuwoVincent van GoghOkirikiri MetonicNtọala Ntụkwasị ObiXXXTentacionBurundiEkwentịWikipediaMusaAzụSnowball Earth (manga)Tangale peopleOnye nlekọta nke ndị ogbenyeOge Ọrụ (Coal Mines) Nzukọ, 1931Terry GEnglish🡆 More