Ọru Aka bụ ọrụ e ji emepụta ihe nka di iche iche.
obere ụdị nke | occupation |
---|---|
mụrụ ya | sociology of professions |
nwere àgwà | specialty |
ndị n'eme ya | professional |
megidere nke | hobby |
Ihe onwunwe Wikidata | Ọrụ ọ na-arụ |
Ihe a na-akpọ ndi na-arụ ya bụ ndi ọrụ aka. Ndi ọrụ aka bụ ndi gara ọzụzụ were turu ugo na nka di iche iche. Ha jiri anya nka na nkuzi ha natara na-arụpụta ihe ndi gụnyere oche, akwa ndina, tebulu na kabinet. Ndi nọ na otu iji osisi aruputa ihe ndia ka a na-akpọ ọkwa nkà. Ndi ọrụ aka gụnyekwara ndi na-akwa akwa, ịkpa akwa, ndi na-esi nri, ndi na-edozi ụlọ, ndi na-eme achịcha, ndi na-edozi ụgboala di iche iche, ndi na-akpa isi, ịkpụ ụzụ na ndi na-edozi akarangwa mebiriemebi. Ọtụtụ n'ime ha bụ ndi nwere onwe ha ma chọtakwa ụmụ ọrụ na-enyere ha aka na ụlọ ọrụ ha. Ọtụtụ bụ ndi ewere na ụlọ ọrụ bekee ka ha na-edozi ihe ndi mebiri emebi ebe ahụ, dika ọkụ, eletrik na jeneratọ. Ọru Aka bụ otu ụzọ di mkpa ndi mmadụ si enye onwe ha ọrụ ma na-ekesakwa ọrụ na ala anyi ọkachasi ugbua ọrụ gọọmentị na adighi. Ndi ọrụ aka jupụtara ebe nile. A naghi-achọ ha achọ na okporo ụzọ m'oli.
N'oge mbụ, ndi chọrọ ịmụ ọrụ aka na-aga na nke onye nwere ya, kwụọ ya ụgwọ. Ha na-akwụziri ndi ahụ ụru, ihe dịka otụtụ onwa mọbụ otụtụ afọ tupu e duo onye ahụ ka ọmalite nke ya. O ka nwekwara ebe ọ di otu ahụ mbọchi taa. Ma enwekwaziri ọtụtụ ụlọ akwụkwọ, ebe ndi mmadụ na-agakwa mụọ ọrụ aka. Ha na-agụ ya ka e si agụ akwụkwọ na mahadum tupu ha turu ugo pụta mepekwa ya n'ụdị pụrụ iche. Nwoke na nwanyị na-arụ ọrụ aka n'ihi na igbo kwetara na “aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ, a rụọ n’anwụ, erie na ndo, ike kete, o rie, onye rụọ, ya erie. Ọzọkwa bụna orụ aka bụ maka ndi na-agba mbọ. I jimatụ, a nahụta ndi igbo dika ndi na-agba mbọ. Ya mere e jiri kwuo so "onye Igbo bụ onye e ji ịgba mbọ mara. Ọ na-agba mbọ ịkpata nke ọ ga-eri, nke ọga-eji nyere nne na nna ya na ọha izugbe aka."
This article uses material from the Wikipedia Ìgbò article Ọrụ Aka, which is released under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 3.0 license ("CC BY-SA 3.0"); additional terms may apply (view authors). Ọdịnaya dị n'okpuru CC BY-SA 4.0 belụsọ na edere ya otú ọzọ. Images, videos and audio are available under their respective licenses.
®Wikipedia is a registered trademark of the Wiki Foundation, Inc. Wiki Ìgbò (DUHOCTRUNGQUOC.VN) is an independent company and has no affiliation with Wiki Foundation.